bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Numbers 27
Numbers 27
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 28 →
1
Ụmụ ndị inyom Zelofehad nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase bụ ndị si nʼagbụrụ Manase nwa Josef. Aha ndị inyom ndị a bụ: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. Ha bịara,
2
nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, guzo nʼihu Mosis, na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu niile na ọgbakọ Izrel niile kwuo sị,
3
“Nna anyị Zelofehad nwụrụ nʼọzara ma ọ bụghị otu nʼime ndị sonyere Kora, bụ ndị ahụ zukọtara megide Onyenwe anyị. Ọ nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie nke ya. Ma otu ọ dị, ọ mụtaghị nwoke.
4
Gịnị ga-eme a ga-eji hichapụ aha nna anyị site nʼagbụrụ ya nʼihi na ọ mụtaghị nwoke? Ọ bụ uche anyị na e kwesiri ikenye anyị oke nʼoge a na-enye ụmụnne nna anyị oke.”
5
Ya mere, Mosis butere mkpa ha nʼihu Onyenwe anyị.
6
Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya,
7
“Ihe ụmụ Zelofehad na-ekwu ziri ezi. Ị ghaghị ikenye ha oke nʼetiti ụmụnne nna ha, ma nyefeekwa ha oke ruru nna ha.
8
“Gwa ndị Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwoke, oke niile ruru ya ga-alara nwa ya nwanyị.
9
Ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwanyị, oke ruru ya ga-alara ụmụnne ya ndị nwoke.
10
A sịkwa na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, mgbe ahụ oke ya ga-alara ụmụnne nna ya ndị nwoke.
11
Ọ bụrụkwa na o nweghị ndị nwoke bụ ụmụnne nna ya, mgbe ahụ ihe nketa ya ga-alara onye dịkarịrị ya nso nʼikwu ya, ka ọ bụrụ nke ya. Nke a bụ iwu dịrị ndị Izrel niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.’ ”
12
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya: “Gaa rigoro nʼugwu Abarim site nʼebe ahụ lefee anya nʼofe mmiri Jọdan leruo ala ahụ nke m nyere ụmụ Izrel anya.
13
Mgbe i lechasịrị ya, ị ga-anwụ dịka nwanne gị Erọn nwụrụ.
14
Nʼihi na unu nupuru isi nye okwu m nʼọzara Zin, mgbe ọgbakọ ụmụ Izrel sesịrị m okwu. Unu abụọ nupuru isi nʼiwu m ido m nsọ nʼihu ha.” (Ndị a bụ mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.)
15
Mosis zara Onyenwe anyị sị ya,
16
“Ka Onyenwe anyị, Chineke nwe mmụọ nke mmadụ niile, họpụta onyendu ga-elekọta ọgbakọ a.
17
Onye ga na-apụ na-abatakwa nʼihu ha, onye ga na-edu ha pụọ, duru ha batakwa, ka ndị Onyenwe anyị ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ.”
18
Ya mere, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Kpọrọ Joshua, nwa Nun, onye nwere mmụọ Chineke nʼime ya, bikwasị ya aka gị.
19
Mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja, nakwa nʼihu ọgbakọ niile, nyefee ya ọrụ nke ịbụ onyendu nʼihu ha.
20
Nyekwa ha ụfọdụ ikike gị, ka nzukọ niile nke ụmụ Izrel nwee ike rubere ya isi.
21
Ma ya onwe ya ga-eguzo nʼihu Elieza onye nchụaja, onye ga-ajụrụ ya ase site na mkpebi Urim nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-apụ, site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-ana abata. Ma ya onwe ya, ma ndị Izrel niile, tinyekwara nzukọ niile.”
22
Ya mere, Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. O duuru Joshua mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja na ọgbakọ niile.
23
Mosis bikwasịrị aka ya abụọ nʼisi Joshua, rara ya nyefee maka ije ozi ahụ niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 28 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36