bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Proverbs 25
Proverbs 25
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 24
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 26 →
1
Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ.
2
Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu, ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu.
3
Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala, otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta.
4
Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha, onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere;
5
wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze, ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume.
6
Egosipụtala onwe gị nʼihu eze, ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ,
7
ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, “Rigota nʼebe a,” karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ. Ihe iji anya gị abụọ hụ
8
e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe, nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụ ma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere?
9
Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu, emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru,
10
ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere, agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ.
11
Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha.
12
Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya.
13
Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ, dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.
14
Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.
15
Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri, nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ.
16
Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ? Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa.
17
Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị.
18
Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha, dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.
19
Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe, maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ.
20
Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ, maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya, otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị.
21
Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.
22
Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya, Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.
23
Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo, otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.
24
Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.
25
Oziọma e sitere na mba dị anya nata dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.
26
Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwuru dị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya.
27
Dịka ịracha mmanụ aṅụ hie nne si jọọ njọ, otu a ka o si bụrụ ihe na-enweghị nsọpụrụ, mmadụ ịchọpụta ihe ndị ezomiri ezomi.
28
Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.
← Chapter 24
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 26 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31