bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 John 3
1 John 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 4 →
1
Lee ka Nna anyị bi nꞌeluigwe si hụ anyị nꞌanya, nꞌihi na o sitere nꞌamara ya mee ka a kpọọ anyị ụmụ ya. Nꞌezie, anyị bụkwa ụmụ Chineke. Ma ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ amaghị Chineke ha adịghị aghọta na anyị bụ ụmụ Chineke.
2
Ya mere, ndị enyi m, anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị dị ka ụmụ Chineke ga-abụ nꞌoge dị nꞌihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka Kraịst pụta ìhè a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nꞌihi na anyị ga-ahụ ya dị ka ọ dị.
3
Onye ọ bụla nwere olileanya dị otu a kwesịrị idebe onwe ya nsọ, nꞌihi na Kraịst nꞌọnwe ya dị nsọ.
4
Ma ndị ahụ na-anọgide nꞌime mmehie na-emehie megide Chineke. Nꞌihi na mmehie ọ bụla mmadụ mere bụ mmehie megide ihe Chineke naachọ.
5
Unu maara nke ọma na e mere ka Kraịst pụta ìhè iwepụ mmehie anyị nile. O dịkwaghị mmehie ọ bụla dị nꞌime ya, ọ dịghị mgbe ọ bụla o mere ihe Chineke na-achọghị.
6
Ya mere, ọ bụrụ na anyị anọọ Kraịst nso na-eme ihe ọ chọrọ, anyị agaghị ebi ndụ mmehie. Ma ndị ahụ na-ebi ndụ mmehie na-ebi ndụ ahụ nꞌihi na ha amaghị onye Chineke bụ. Ha abụkwaghị ndị a zọpụtara azọpụta.
7
Ụmụ m, ndị m hụrụ nꞌanya, unu ekwela ka onye ọ bụla duhie unu. Ọ bụrụ na ị na-ebi ndụ ime ezi ihe mgbe nile ọ bụ nꞌihi na ị bụ ezi mmadụ dị ka ya onwe ya si bụrụkwa onye na-eme ezi ihe.
8
Ma ọ bụrụ na ị na-anọgide na-ebi ndụ ime mmehie oge nile, o gosiri na ị bụ nke ekwensu. Nꞌihi na ekwensu bụ onye na-emehie site na mmalite ihe dum. Mmehie bụkwa aka ọrụ ya. Ma Jisọs Ọkpara Chineke bịara nꞌụwa ịla ike na ọrụ nile nke ekwensu nꞌiyi.
9
Onye a mụrụ ọzọ, nke a mụbatara nꞌezinụlọ Chineke adịghị anọgide na-eme mmehie. Nꞌihi na ndụ Chineke dị nꞌime ya. Ọ pụghị ịnọgide nꞌime mmehie nꞌihi na ndụ ọhụrụ dị nꞌime ya na-achị ya.
10
Ya mere, anyị pụrụ ịkọwa onye bụ nwa Chineke na nwa ekwensu. Onye ọ bụla na-ebi ndụ ime mmehie na nke na-ahụghị nwanna ya nꞌanya esiteghị nꞌezinụlọ Chineke.
11
Nꞌihi na bido na mmalite ihe nile okwu a gwara anyị bụ na anyị kwesịrị ịhụ mmadụ ibe anyị nꞌanya dị ka onwe anyị.
12
A chọghị ka anyị dịrị ka Ken onye weere onye nyefee nꞌaka ekwensu. Ken gburu Ebel nwanne ya nꞌihi na ọ maara na ndụ Ebel dị mma karịa nke ya.
13
Ya mere, ka ọ ghara iju unu anya ma ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị.
14
Ọ bụrụ na anyị ahụ ndị Kraịst ibe anyị nꞌanya, ọ na-ezipụta na a gbapụtala anyị site nꞌọkụ ala mmụọ nye anyị ndụ ebighị ebi.
15
Onye ọ bụla kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ nꞌime obi ya. Anyị maara na o nweghị onye na-eche echiche igbu mmadụ pụrụ inwe ndụ ebighị ebi.
16
Jisọs egosila anyị ihe bụ ịhụ mmadụ nꞌanya, nꞌihi ọnwụ ọ nwụrụ. Ya mere anyị kwesịkwara ịtọgbọ ndụ anyị nꞌihi ụmụnna anyị nꞌime Kraịst.
17
Ọ bụrụ na otu nwanna nꞌime Kraịst mkpa na-akpa bịakwutere otu onye kpọrọ onwe ya onye Kraịst nwere akụ na ụba na ihe oriri, ma nwanna nwere akụ na ụba ahụ emechie obi ya nꞌebe nwanna ahụ nọ, jụ inyere ya aka, ịhụnanya Chineke ò si aṅaa dịrị nꞌime onye dị otu a?
18
Ndị m hụrụ nꞌanya, ka ngosi anyị na-egosi ịhụnanya anyị nꞌebe ndị ọzọ nọ ghara ịbụ nanị nꞌegbugbere ọnụ anyị na ikwu okwu efu. Kama ka anyị na-egosi ya site nꞌokwu ọnụ anyị na omume anyị.
19
Mgbe ahụ anyị pụrụ isite nꞌomume anyị mata nꞌezie na anyị na-eme ihe Chineke chọrọ. Mgbe ahụ kwa akọnuche anyị agaghị ama anyị ikpe, ọ bụladị ma anyị guzoro nꞌihu Chineke.
20
Nꞌihi na ọ bụrụ na akọnuche anyị ama anyị ikpe Chineke dị ukwuu karịa akọnuche anyị, ọ mazukwara ihe nile.
21
Ndị m hụrụ nꞌanya, ọ bụrụ na akọnuche anyị amaghị anyị ikpe anyị pụrụ iji ntụkwasị obi na obi dị ọcha bịakwute Chineke
22
nata ya ihe ọ bụla anyị na-arịọ nꞌaka ya, nꞌihi na anyị na-erube isi nꞌiwu ya, na-eme ihe na-atọ ya ụtọ.
23
Nke a bụkwa ihe Chineke na-agwa anyị ka anyị mee. Ọ bụ ikwere nꞌaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst na ịhụ mmadụ ibe anyị nꞌanya.
24
Ndị nile na-eme ihe Chineke kwuru na-anọgidesikwa ike nꞌime ya. Chineke nꞌonwe ya na-anọgidesikwa ike nꞌime onye ahụ. Anyị maara na nke a bụ eziokwu nꞌihi na Mmụọ Nsọ bi nꞌime anyị na-agwa anyị otu ihe ahụ.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5