bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 John 5
1 John 5
Igbo 1988
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
1
Ọ bụrụ na i kwere nꞌezie na Jisọs bụ Kraịst onye nzọpụta gị na Ọkpara Chineke, ị bụ nwa Chineke. Ndị nile kwa hụrụ Chineke nꞌanya naahụkwa ụmụ Chineke nꞌanya.
2
Anyị pụrụ isite nꞌụdị ịhụnanya anyị nwere nꞌebe Chineke nọ ya na ụdị nrube isi anyị na-erubere ya mata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nꞌanya.
3
Gịnị bụ ịhụ Chineke nꞌanya? Ọ bụ ime ihe ahụ Chineke chọrọ ka anyị mee. Idebuzukwa iwu Chineke nile adịghị enye nsogbu.
4
Nꞌihi na nwa Chineke ọ bụla emeriala ụwa. Nke a bụkwa ụzọ mmeri ahụ si abia, site nꞌokwukwe anyị.
5
Onye pụrụ inwe ụdi mmeri a? Ọ bụ onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke nꞌezie.
6
Onye matakwara na Jisọs bụ Okpara Chineke nꞌihi na Chineke si nꞌeluigwe kwuo na Jisọs bụ Ọkpara ya mgbe e mere Jisọs baptizim. Chineke kwukwara okwu dị otu a nꞌoge ọnwụ Jisọs. Ee, olu esiteghị nꞌeluigwe kwuo okwu nanị nꞌoge e mere Jisọs baptizim, kama o kwuru okwu nꞌoge ọnwụ ya.
7
Mmụọ Nsọ, onye okwu ya nile bụ eziokwu, kwukwara otu ihe ahụ. Ya mere, anyị nwere ndị akaebe atọ: Olu Mmụọ Nsọ na-ekwu okwu nꞌobi anyị, na olu ahụ si nꞌelu kwuo okwu nꞌoge e mere Jisọs baptizim, na nꞌoge ọnwụ ya. Olu ndị a nile na-ekwukwa otu ihe ahụ, na Jisọs bụ Ọkpara Chineke.
8
Ha atọ kwekọtara nꞌotu ihe ahụ.
9
Nꞌụlọ ikpe anyị, anyị na-anabata ọgụgba ama ndị mmadụ dị ka eziokwu. Anyị kwesịkwara ịnabata ama Chineke gbara. Nꞌihi na Chineke kwuru na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara ya.
10
Anyị nile kweere okwu Chineke maara na ọ bụ eziekwu. Onye na-adịghị ekwenye nꞌihe Chineke kwure banyere Jisọs Kraịst na-akpọ Chineke onye okwu ụgha. Nꞌihi na onye dị otu a ekweghị nꞌama Chineke gbara banyere Jisọs Ọkpara ya.
11
Gịnị bụ ihe ahụ Chineke kwuru? Chineke sị na ya enyela anyị ndụ ebighị ebi. Na ndụ ebighị ebi ahụ dị nꞌime Jisọs Ọkpara ya.
12
Onye ọ bụla nabatara Jisọs nꞌime obi ya nwere ndụ. Ma onye na-anabataghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ ahụ.
13
Ana m edere unu akwụkwọ a unu ndị kweere nꞌỌkpara Chineke ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi.
14
Anyị nwekwara ntụkwasị obi na Chineke ga-anụ ekpere anyị mgbe ọ bụla anyị nịọrọ ya ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ ya si dị.
15
Ọ bụrụ na anyị maara na ọ na-ege anyị ntị mgbe ọ bụla anyị kpọkuru ya chee mkpa anyị nꞌihu ya, anyị nwere ntụkwasị obi na ọ ga-aza ekpere anyị.
16
Ọ bụrụ na ị hụ nwanna nꞌime Kraịst ka ọ na-eme mmehie na-adịghị edube onye na-eme ya nꞌọnwụ, kpee ekpere nꞌihi ya rịọ Chineke ka ọ gbaghara ya. Chineke ga-enyekwa ya ndụ. Ọ bụ nanị mgbe ị maara na mmehie ya bụ nke na-eduba onye mere ya nꞌọnkụ ka ị ga-ahapụ ikpere ya ekpere.
17
Ihe ọ bụla na-ezighị ezi mmadụ mere bụ mmehie nꞌihu Chineke. Ma ihe m na-ekwu nꞌebe abụghị ihe banyere ụmụ mmehie ndị mmadụ na-eme. Ana m ekwu ihe banyere mmehie ahụ na-eduba ndị mere ya nꞌọnwụ.
18
O nweghị onye ọ bụla a gbapụtara kpọbata nꞌezinụlọ Chineke ga-anọgide na-eme mmehie, nꞌihi na Kraịst Ọkpara Chineke na-echebe ya ka onye iro ahụ bụ ekwensu hapụ imetụ ya aka.
19
Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, matakwa na ndị nọ nꞌụwa nọ nꞌokpuru ọchịchị ekwensu.
20
Anyị matakwara na Kraịst Ọkpara Chineke abịala inyere anyị aka ịchọta Chineke. Ugbu a anyị na-anọgide nꞌime Chineke nꞌihi na anyị nọ nꞌime Jisọs Kraịst Ọkpara ya, onye nanị ya bụ Chineke nꞌezie, na onye bụkwa ndụ ebighị ebi.
21
Ya mere, ụmụ m ndị m hụrụ nꞌanya, wezụganụ onwe unu site nꞌihe nile ahụ ga-achọ iwere ọnọdụ ahụ Chineke nọ nꞌime unu.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
All chapters:
1
2
3
4
5
Recommended Reading
Commentary
1 John Commentaries
→
Devotional
1 John Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→