bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Thessalonians 1
1 Thessalonians 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 2 →
1
Akwụkwọ ozi a si nꞌaka anyị, Pọl na Saịlas na Timoti, na-abịara nzukọ Kraịst dị na Tesalonaịka, ndị e jikọtara ha na Chineke Nna, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka Chineke gọzie unu, ma nyekwa unu udo.
2
Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe nile, na-echetakwa unu nꞌekpere anyị.
3
Mgbe nile ka anyị na-echeta nꞌekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nꞌokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nꞌịhụnanya, na iguzosị ike unu nke sitere nꞌolileanya unu nwere nꞌOnyenwe anyị Jisos Kraịst.
4
Ụmụnna anyị, anyị maara na Chineke hụrụ unu nꞌanya nke ukwuu, họpụta unu.
5
Nꞌihi na mgbe anyị wetaara unu ozi ọma, unu eweghị ya dị ka okwu na-erijughị afọ, kama unu gere nnọọ ntị nke ọma. Okwu nile anyị gwara unu metụkwara mmụọ unu, nꞌihi na Mmụọ Nsọ mere ka unu ghọta nꞌezie na ihe anyị kwuru bụ eziokwu. Unu matakwara otu ndụ anyị si bụrụ ihe ilere anya nye unu, igosi unu na okwu anyị ji bịa bụ eziokwu.
6
Nke a mere unu ji bụrụ ndị na-eso ụzọ anyị na ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị. Nꞌihi na unu jiri ọṅụ Mmụọ Nsọ na-enye nabata ozi ọma anyị, na-ajụghị ajụjụ banyere ọnwụnwa na obi ọjọọ o wetaara unu.
7
Nꞌụzọ dị otu a unu mesịrị bụrụ ihe ilere anya nye ndị kwere ekwe nile nọ na Masidonia na Griis.
8
Ugbu a unu esitela na ndụ unu mee ka ozi ọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Griis. Nꞌihi na ebe ọ bụla anyị gara anyị na-ahụ ndị na-agwa anyị ihe banyere okwukwe dị iche unu nwere. Anyị adịkwaghị agwa ndị mmadụ ihe banyere okwukwe unu.
9
Nꞌihi na ha onwe ha na-ebu ụzọ gwa anyị ihe banyere nnabata unu nabatara anyị, na otu unu si site nꞌikpere arụsị tụgharịa bido ife Chineke, na otu unu si na-ebi ndụ unu ugbu a nye ezi Chineke ahụ bụ Onyenwe unu.
10
Ha na-akọkwa otu unu si na-ele anya nlọghachi Okpara Chineke site nꞌeluigwe, Jisọs ahụ Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilie, onye bụ Onye nzọpụta anyị site nꞌiwe Chineke dị egwu megide mmehie.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5