bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Thessalonians 3
1 Thessalonians 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 4 →
1
Ya mere, mgbe anyị na-apụghị ịnagide ya gaa nꞌihu, anyị kpebiri ịnọ nanị anyị nꞌobodo Atens.
2
Anyị zipụrụ Timoti, nwanna anyị, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ ọma Jisọs Kraịst, ka ọ bịakwute unu, kasie unu obi, nyekwara unu aka nꞌokwukwe unu.
3
Ka unu hapụ ịda mba nꞌihi mkpagbu ndị a a na-akpagbu unu. Ma ana m eche na unu onwe unu maara na nsogbu dị otu a bụ ihe Chineke zubere nye anyị.
4
Nꞌihi na mgbe anyị na unu nọ, anyị buru ụzọ gbaara unu ama na ihe ndị a aghaghị ịbịakwasị unu. Ugbu a ihe anyị kwuru emezuola.
5
Dị ka m na-ekwu na mbụ, mgbe m hụrụ na m apụghị ịnagide ihe ndị ahụ, ezipụrụ m Timoti, ka ọ bịa chọpụta ma okwukwe unu ọ dịkwa chịm. Nꞌihi na ihe tụrụ m ụjọ bụ na ma eleghị anya onye ọnwụnwa ọjọọ ahụ bụ ekwensu ga-emeri unu nꞌoge ọnwụnwa ndị a, mee ka ọrụ nile anyị rụrụ nꞌetiti unu bụrụ ihe lara nꞌiyi.
6
Ma ugbu a, Timoti esitela nꞌebe unu nọ lọghachikwute anyị. O mere ka anyị mata na okwukwe unu guzo chịm; o mekwara ka anyị mata na unu na-echeta anyị mgbe nile. Na ọ na-akpasị unu mkpa ike ịhụ anyị anya, dị ka o si akpa anyị mkpa ịhụ unu anya.
7
Nꞌihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a kasịrị obi nke ukwuu ọ bụladị nꞌime mkpagbu nile nke anyị nọ nꞌime ya, nꞌihi iguzosi ike nke unu guzoro nꞌokwukwe unu.
8
Ugbu anyị pụrụ ịnagide ọnọdụ ọjọọ ọ bụla ruo oge ọ bụla, ebe anyị maara na unu guzosiri ike nꞌime Onyenwe anyị.
9
Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nꞌihi akụkọ a anyị nụrụ banyere unu?
10
Nꞌihi na ehihie na abalị nile, na-esepụghị aka, ka anyị na-arịọ Chineke arịrịọ banyere unu site na ntọ ala obi anyị. Arịrịọ anyị na-arịọ ya bụ ka o mee ka anyị hụ unu anya ọzọ. Ka anyị nwee ike inyere unu aka nꞌokwukwe unu.
11
Ugbu a, ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst megheere anyị ụzọ ịbịakwute unu ọzọ.
12
Ka Chineke meekwa ka ịhụnanya unu too eto, ka ọ babiga oke, rute ibe unu, na ndị ọzọ kwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị nꞌebe unu nọ.
13
Nke a ga-eme ka Chineke Nna anyị nye unu obi siri ike, nke dị nsọ, na nke na-enweghị ntụpọ ọ bụla, ka unu nwee ike iguzo nꞌihu ya dị ka ndị a na-apụghị ịta ụta nꞌụbọchị ahụ Jisọs na ndị ya nile ga-alọghachi.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5