bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
James 3
James 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 4 →
1
Ụmụnna m, ka ọtụtụ nꞌime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, ndị ọrụ ha bụ igosi ndị ọzọ ebe ha siri mehie. Nꞌihi na ebe ndị nkuzi bụ ndị a na-ele anya na ha ma ihe karịa ibe ha, ha gaanata ikpe ọmụma karịrị ukwuu ma ọ bụrụ na ha emehie.
2
Ọtụtụ mgbe, na nꞌụzọ dị iche iche, ka anyị na-emehie. Ma onye ọ bụla nke na-adịghị emehie site nꞌikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke na onye pụrụ ijide anụ ahụ ya aka.
3
Anyị nwere ike ime ka inyinya mee ihe anyị chọrọ ka o mee, ma ọ bụ gaa ebe anyị chọrọ ka ọ gaa, ma ọ bụrụ na anyị etinye eriri igwe nꞌọnụ ya.
4
Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nꞌosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nꞌịtụgharị ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ.
5
Otu a ka ọ dịkwa ire anyị. Ọ bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma ọ na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Kwụsịdị chee echiche ụdị ọhia nke icheku ọkụ ntakịrị pụrụ ime ka o nwuru ọkụ.
6
Ire anyị dị ka ọkụ. A tulee ya na akụkụ ọzọ dị nꞌahụ anyị, ọ dị ka nsi. Ọ pụrụ ịmerụ na imebi ndụ anyị nile dị ka otu icheku ọkụ pụrụ isi repịa ụlọ. Ọ bụkwa ọkụ na-esite nꞌọkụ ala mmụọ abịa ka e ji amụnye ire anyị ọkụ ime ka okwu na-esite nꞌire anyị pụta bụrụ ihe na-ebute mmebi na ịla nꞌiyi nye ndụ anyị.
7
Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri,
8
ma mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire ya.
9
Ọ bụ ire anyị ka anyị ji eto Chineke bụ Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ire anyị ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nꞌoyiyi nke ya.
10
Site nꞌotu ọnụ anyị ka ija mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a ọ̀ bụ ihe ziri ezi? Ọ dịghị!
11
Ọ̀ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nꞌotu isi iyi ahụ na-asọpụta?
12
Ụmụnna m, osisi oroma ọ̀ pụrụ ịmụ ube? Ka osisi ube ọ pụrụ ịmịpụta oroma? Nꞌụzọ dị otu a anyị makwaara na mmiri nnu na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ apụghị isite nꞌotu isi iyi asọpụta.
13
Ọ̀ dị onye ọ bụla nꞌime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nꞌibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nꞌobi umeala nke ịnya isi na-adịghị.
14
Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nꞌihe ilu na ekworo, o kwesịghị ka unu kwusie okwu ike banyere amamihe unu na ịdị mma unu. Nꞌihi na nke a abụghị eziokwu.
15
Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nꞌebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa, amamihe nke ekwensu, ọ bụghị amamihe nke Mmụọ Nsọ.
16
Nꞌihi na ebe ọ bụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka unu ga-achọta igba aghara na omume ọjọọ.
17
Ma amamihe na-esite nꞌebe Chineke nọ abịa dị ọcha. Ọ hụrụ udo nꞌanya, ọ na-eme obi ọma, o jupụtara nꞌebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịkwaghị nꞌime ya.
18
Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ nke ezi omume.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5