bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
James 5
James 5
Igbo 1988
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
1
Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge ruola mgbe unu kwesịrị ịkwa akwa na ịsụ ude nꞌihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu.
2
Akụ na ụba unu ebidola ịta ajarị, mkpu ebidokwala irichasị uwe ọma unu.
3
Ọlaọcha na ọlaedo unu ejupụtala nꞌịtarị. Ajarị a ga-abụkwa ama megide unu, ọ gaerepịa anụ ahụ unu dị ka ọkụ. Unu akpakọtaala akụ nꞌụbọchị ikpeazụ ndị a.
4
Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesịrị na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị bụ Onye pụrụ ime ihe nile.
5
Unu ebiela ndụ nke oke oriri na oke ọṅụṅụ, ndụ inye anụ ahụ unu ihe ọ bụla na-akpa ya mkpa. Ma ugbu a anụ ahụ unu ahụ gbara abụba ejikerela na-eche ikpe nke na-abịa.
6
Unu amaala ndị aka ha dị ọcha ikpe ọmụma, gbuokwa ha, ọ bụladị mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ ha bu nꞌobi ha megide unu.
7
Nweenụ ndidi ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa nke Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nꞌubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya.
8
Unu onwe unu kwesịkwara inwe ndidi guzosiekwa ike nꞌihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.
9
Ụmụnna m, unu atamụla ntamụ megide ibe unu, ka Chineke hapụ ikpe unu ikpe. Ọbịbịa ya dị nso. Ọ gaabịakwa!
10
Ụmụnna m, ùnu chọrọ ihe ga-abụrụ unu ihe ilere anya banyere otu ndị Chineke si anagide ahụhụ? Mgbe ahụ mụtanụ ihe site na ndụ ndị amụma kwuru okwu nꞌaha Chineke, na ahụhụ nke ha hụrụ.
11
Anyị na-agụ ha ugbu a dị ka ndị a gọziri agọzi nꞌihi na ha diri ahụhụ. Unu anụla akụkọ Job, otu o siri hụọ ahụhụ na otu Chineke siri gọzie ya nꞌikpeazụ. Chineke bụ onye jupụtara nꞌobi ebere na ọmiko.
12
Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọ bụla, ọ bụladị iji eluigwe ma ọ bụ ụwa ṅụọ iyi. Kama ka “ee” unu bụrụ “ee”. Ka “é, è” unu bụrụkwa “é, è”. Ka unu hapụ isite nꞌụzọ dị otu a mehie wetakwara onwe unu ịbụ ọnụ Chineke.
13
Ọ̀ dị onye ọ bụla nꞌetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ̀ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ ito Chineke.
14
Ọ̀ dị onye nọ nꞌetiti unu ahụ naesighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nꞌisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
15
Ọ bụrụkwa na ha sitere nꞌokwukwe kpeere Chineke ekpere ha, a ga-eme ka ahụ dị onye ọrịa ahụ mma. Onyenwe anyị ga-emekwa ka o site nꞌute ọrịa bilie. Ọ bụrụkwa na o mehiere, ọ ga-agbaghara ya mmehie ya.
16
Ya mere, kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu, kpeekwara ibe unu ekpere ka Chineke gwọọ unu. Chineke na-anụ ekpere onye ezi omume, na-azakwa ya.
17
Ịlaịja onye amụma, bụrị mmadụ efu dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị ruo afọ atọ na mkpirisi.
18
Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, nke mere ka mmiri zoo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri.
19
Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌetiti unu esite nꞌeziokwu Chineke jehie, ma otu onye nꞌime unu akpọghachi ya azụ nꞌeziokwu ahụ,
20
onye ahụ kpọghachiri onye njehie ahụ nꞌebe Chineke nọ azọpụtala mkpụrụ obi kpafuru akpafu site nꞌọnwụ. Ọ bụ ihe pụrụ ime na mkpụrụ obi ahụ ga-anata mgbaghara nꞌihi ọtụtụ mmehie ya.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
All chapters:
1
2
3
4
5