bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Philippians 2
Philippians 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 3 →
1
Ugbu a, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọ bụla dịrị anyị nꞌihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere ihe dị ka inyeaka nke si nꞌịhụnanya na-abịa, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọ bụla anyị na-enwekọ nꞌime Mmụọ Nsọ, ọ bụrụ na unu nwere obi ebere, jikerekwa ime ebere,
2
meenụ ka m ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, site nꞌibi obi nke ịhụrịta onwe unu nꞌanya, site nꞌinwe nkwekọta nꞌihe ọ bụla, sitekwa nꞌiji otu obi, otu nzube, na otu mmụọ na-arụkọta ọrụ unu.
3
Echela echiche nanị banyere ọdịmma nke gị, ebila ndụ nꞌụzọ ịdọtara onwe gị otuto ndị ọzọ. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye echiche ya bụ ile ndị ọzọ anya dị ka ndị ka ya mma.
4
Echela echiche banyere nanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya nꞌihe banyere ndị ọzọ na ihe ha na-eme.
5
Ka omume unu nile dịrị ka nke Jisọs Kraịst.
6
Onye, ọ bụ ezie na ọ bụ Chineke, ma ọ gụghị ike ya na ọdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike.
7
Kama, o wedara onwe ya ala bịa nꞌụwa dị ka ohu, na onye na-adịghị ike. O kwenyere ka a mụọ ya dị ka e si mụọ mmadụ nile bi nꞌụwa.
8
Ebe ọ bịara nꞌụwa dị ka mmadụ, o wedakwara onwe ya ala, rube isi họrọ ịnwụ ọnwụ jọkarịsịrị njọ, ọnwụ ihere, nke ịbụ onye a kpọgidere nꞌelu obe.
9
Ọ bụ nꞌihi nke a ka Chineke ji site nꞌọnwụ kpọlite ya, welie ya elu, mee ka ọ nọdụ ugbu a nꞌebe kachasị elu, nyekwa ya aha nke karịrị aha nile ọ bụla elu.
10
Ka e site nꞌịkwanyere ya ugwu, mee ka ndị nile bi nꞌụwa, na ndị bi nꞌeluigwe, na ndị bi nꞌokpuru ụwa, gbuo ikpere ha nꞌala, ịsọpụrụ Jisọs mgbe ọ bụla a kpọrọ aha ya.
11
Ọzọ kwa, ka ire nile kwupụta na Kraịst bụ Onyenwe anyị, ka e si otu a nye Chineke bụ Nna otuto.
12
Nꞌihi ihe ndị a, ndị enyi m, mgbe mụ na unu nọ, unu na-erube isi nꞌihe ọ bụla m gwara unu. Ugbu a kwa m na-anọghị unu nso, gbalịanụ ime ihe ndị ahụ ya na nzọpụta a zọpụtara unu so. Jirinụ ịtụ egwu na-eme ihe Chineke chọrọ, ma na-alanụ azụ nꞌihe ọ bụla pụrụ ime ka obi jọọ ya njọ nꞌebe unu nọ.
13
Nꞌihi na ọ bụ Chineke nꞌonwe ya na-arụ ọrụ nꞌime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe ọ chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ ọ chọrọ.
14
Nꞌihe ọ bụla unu na-eme, wezuganụ ntamụ na ịrụ ụka nꞌetiti unu.
15
Bienụ ndụ unu dị ka ụmụ Chineke, ndị a na-apụghị ịta ụta, ndị dị ọcha na ndị a na-apụghị ibo ebubo nꞌime ụwa ọjọọ a, nꞌetiti ndị gbagọrọ agbagọ, na nꞌetiti ndị nwere obi nꞌazụ. Na-enwunụ nꞌetiti ha dị ka ìhè.
16
Na-echekwanụ nꞌihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nꞌihi na ọrụ m rụrụ nꞌetiti unu abụghị ihe efu.
17
Nꞌezie, ọ bụrụ na a wụsịa ọbara m dị ka ihe ịchụ aja nye Chineke nꞌihi okwukwe unu, ee, a sị na e gbuo m nꞌihi unu, aga m aṅụrị ọṅụ meekwa ka unu soro m ṅụrịa ọṅụ.
18
Unu kwesịrị ịṅụrị ọṅụ nꞌihi nke a, na isoro m ṅụrịa ọṅụ.
19
Ọ bụrụ na Onyenwe anyị Jisọs ekwe, aga m ezite Timoti ka ọ bịa hụ unu na mgbe na-adịghị anya. Olileanya m bụ na mgbe ọ bịasịrị lee unu lọghachi, ọ ga-akọrọ m ihe banyere unu, na ọnọdụ unu, si otu a kasie m obi.
20
Enweghị m onye ọzọ nọ m nso, bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, na onye ga-akpachapụ anya banyere ọdịmma unu dị ka Timoti.
21
Ndị ọzọ na-echegbu onwe ha banyere mkpa nke aka ha. Ihe banyere ozi Onyenwe anyị Jisọs abụkwaghị mkpa dịrị ha.
22
Ma unu nile maara Timoti. Ọ dị nnọọ dị ka nwa m, site nꞌinyeaka ọ na-enyere m nꞌọrụ Onyenwe anyị.
23
Enwere m olileanya nꞌezie izitere unu ya. M ga-emekwa nke a, ma ọ bụrụ na m chọpụta ihe ọnọdụ m nꞌebe a ga-abụ.
24
Nꞌezie enwere m olileanya na site nꞌinyeaka Onyenwe anyị, mụ onwe m ga-abịakwutekwa unu na mgbe na-adịghị anya.
25
Otu ọ dị, echere m na ọ dị mkpa ugbu a izighachiri unu Epafroditọs. Unu zitere ya ka ọ bịa nyere m aka nꞌọnọdụ mkpa m. Mụ na ya bụ nnọọ ezi nwanne, ndị na-arụkọ ọrụ nꞌotu, dị ka ndị agha Jisọs Kraịst.
26
Ugbu a, ana m eziteghachiri unu ya, nꞌihi na ọ na-agụsị ya agụụ ike ịhụ unu anya. O wutekwara ya nke ukwuu, na e mere ka unu mara na ọ dara ọrịa nꞌoge gara aga.
27
Nꞌezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nꞌọrịa ahụ daa nꞌụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị ya nanị ka Chineke meere ebere, kama o mekwaara m ebere, nꞌihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m mwute gaara abụ nke m, ma a sị na Epafroditọs nwụrụ.
28
Nꞌihi nke a, ọ na-anụ m ọkụ nꞌobi izite ya nꞌebe unu nọ. Nꞌihi na amaara m na ọbịbịa ọ ga-abịakwute unu ga-eme ka unu ṅụrịa ọṅụ. Ọ ga-emekwa ka ọnọdụ nchegbu m dị mfe.
29
Ya mere, arịọọ m unu, werenụ ọṅụ nabata ya nke ọma nꞌime Onyenwe anyị. Gosinụ ya na ọrụ ya dị unu ụtọ.
30
Nꞌihi na ọ fọdụrụ nwa ntịị ka ọ nwụọ, nꞌihi ọrụ ọ na-arụrụ Kraịst. O kwenyere itufu ndụ ya na mgbalị nile ọ gbalịrị, inyere m ụdị aka ahụ unu gaara enyere m, ma ọ bụrụ na unu nọ nso.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4