bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Philippians 4
Philippians 4
Igbo 1988
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
1
Ya mere, ụmụnna m, ndị m hụrụ nꞌanya, na ndị ihe ha na-agụsị m agụụ ike, unu ndị na-enye m ọṅụ, na ndị bụ ụgwọ ọrụ m nꞌihi ọrụ m na-arụ, bikonụ, guzosienụ ike nꞌime Onyenwe anyị.
2
Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, ha kwụsị ise okwu.
3
Ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, sị gị biko, nyere ụmụ nwanyị a aka idozi okwu ha, nꞌihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa ozi ọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, sorokwa ndị ọzọ mụ na ha rụkọrọ ọrụ rụọ ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ ahụ.
4
Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe nile nꞌime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ!
5
Meenụ ka mmadụ nile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obi ọma nꞌihe nile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.
6
Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke.
7
Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs.
8
Ugbu a ụmụnna m, tupu m mechie, achọrọ m ịgwa unu otu ihe a, na-echenụ echiche mgbe nile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọ bụla mabigara mma oke, ihe ọ bụla dị mma na ndụ onye ọ bụla nke e kwesịrị ịṅomi, na nke e kwesịrị inwe otuto nꞌihi ya.
9
Na-emenụ ihe ọ bụla unu si nꞌaka m mụta, ma ọ bụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.
10
Obi dị m nnọọ ụtọ nꞌihi inyeaka unu nyeere m ọzọ. Ana m etokwa Onyenwe anyị nꞌihi ya. Amaara m na ọ dị unu nꞌobi kemgbe izitere m ihe unu nwere ike, ma unu enwebeghị ohere ime ya.
11
Ọ bụghị na m nọ nꞌọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nꞌihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọọ nꞌọnọdụ ọ bụla, ma m nwere ihe ma m enweghị ihe.
12
Amụtala m otu m ga-esi nọọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nꞌọnọdụ ọ bụla, ma ọ bụ mgbe m na-anọ agụụ, ma ọ bụ mgbe m rijuru afọ ma ọ bụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu ma ọ bụ nꞌoge ụkọ.
13
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike.
14
Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nꞌọnọdụ nsogbu nke m nọ nꞌime ya ugbu a.
15
Dị ka unu maara, na mmalite, site na mgbe m kwusaara unu ozi ọma tutuu ruo mgbe m si nꞌetiti unu pụọ, gaa Masidonia, ọ bụ nanị unu ndị Filipai, bụ ndị na-enyere m aka site nꞌinye m onyinye. O nwebeghị chọọchị ọzọ mere ihe dị otu a.
16
Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaika, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m.
17
Ọ bụ ezie na obi na-atọ m ụtọ nꞌihi onyinye unu na-enye m, ma ihe na-enyekarị m ọṅụ nꞌobi m, bụ ncheta m na-echeta ụgwọ ọrụ zuru ezu, unu ga-anata nꞌihi obi ọma unu.
18
Ugbu a enweela m ihe nile na-akpa m mkpa, nꞌezie enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetarạ, egboola mkpa m nile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma.
19
Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu nile, site nꞌụlọ akụ ebube ya nke eluigwe, nꞌihi ihe Kraịst Jisọs meere anyị.
20
Ugbu a ka otuto dịrị Chineke Nna anyị ruo mgbe ebighị ebi. Amin.
21
Keleere m ụmụnna nꞌime Kraịst nile nọ nꞌebe ahụ. Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekelekwa unu.
22
Ndị Kraịst nile nọ nꞌebe a na-ekele unu, karịsịa ndị nọ nꞌụlọ Siza.
23
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
All chapters:
1
2
3
4
Recommended Reading
Commentary
Philippians Commentaries
→
Devotional
Philippians Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→