bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Titus 1
Titus 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 2 →
1
Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, odibo Chineke, na onyeozi Jisọs Kraịst, onye Chineke họpụtara, zipụ, ime ka ndị ahụ ọ họpụtara kwere, na ikuziri ha eziokwu ahụ nke na-agbanwe ndị na-anabata ya,
2
ime ka ha si otu a nwee ndụ ebighị ebi. Chineke onye na-adịghị agha ụgha ekwelarị nkwa tupuu e kee ụwa, inye anyị ndụ ebighị ebi a.
3
Ugbu a oge imezu nkwa ahụ ruru, o meela ka ozi ọma a pụta ìhè. O nyefekwara m ọrụ ịgwa onye ọ bụla ihe gbasara ozi ọma a. Nkwusa nke m na-ekwusakwa ya bụ dị ka Chineke Onye nzọpụta anyị si chọọ.
4
Ọ bụ gị Taitọs, ezi nwa m nwoke nꞌime okwukwe nke anyị nwekọrọ, ka m naedetara akwụkwọ ozi a. Ka Chineke onye bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onye nzọpụta anyị, nye gị amara ya na udo ya.
5
Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ọ bụla dị mkpa nꞌusoro nke ga-enyere ụlọ nzụkọ dị nꞌebe ahụ aka. Ahapụkwara m gị ka ị họpụta ndị isi chọọchị nꞌobodo ahụ nile, ndị ga-eme ihe m nyere gị nꞌiwu.
6
Ndị isi chọọchị ọ bụla ị ga-ahọpụta ga-abụ ndị a maara nke ọma dị ka ndị na-enweghị ntụpọ, ndị nwere nanị otu nwụnye, ndị ụmụ ha kwa bụ ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya, nke ndị mmadụ na-agbara akaebe dị mma na ha abụghị ụmụ naebi ndụ ọjọọ, na ndị na-adịghị erube isi.
7
Ebe ndị isi chọọchị a ga-abụ ndị na-elekọta ọrụ Chineke, ha ga-abụ ndị mmadụ na-apụghị ibo ebubo ihe ọjọọ ọ bụla. Ha agaghị abụ ndị nganga, ndị na-ewe iwe ọkụ, ndị isi ike, ndị na-alụ ọgụ nꞌihi ịṅụbiga mmanya oke, ndị hụrụ ego nꞌanya.
8
Ha ga-abụ ndị na-anabata ndị ọbịa, na ndị hụrụ ihe ọma nꞌanya. Ha ga-abụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha nꞌobi ha, ndị dị nsọ, na ndị isi zuru oke.
9
Ha ga-abụkwa ndị guzosiri ike nꞌeziokwu nke ozi ọma ahụ anyị ziri ha. Nke a ga-eme ka ha nwee ike izi ndị ọzọ eziokwu ahụ, na iji ya zi ndị ahụ na-arụ ụka ebe ha si jehie.
10
Nꞌihi na e nwere ọtụtụ mmadụ ndị na-ekweghị ozi ọma a, nke ka nke, ndị ahụ na-asị na ọ dị mkpa ka onye nke Kraịst debe iwu ndị Juu nile nke. Ma okwu ndị a bụ okwu nzuzu, nke naegbochi ndị mmadụ iso eziokwu.
11
Ihe dị mkpa ugbu a bụ ịkwụsị ndị na-ezi ihe dị otu a, nꞌihi na ha esitela nꞌihe ha na-ezi weta oke nsogbu nꞌọtụtụ ezinụlọ, meekwa ka ndị na-anabata ihe ha na-ezi lefuo amara Chineke anya. Ndị na-ezi ihe a na-eme ya nꞌihi ego ha na-enweta.
12
Ọ bụ otu onye nꞌime ha, onye bụkwa onye amụma ha kwuru okwu banyere ha sị, “Ndị Kriit nile bụ ndị ụgha. Ha kwara obi nꞌazụ dị ka anụ ọhịa jọrọ njọ. Ha bụ ndị umengwụ nwere akpịrị ogologo.”
13
Nꞌezie, ọ bụ eziokwu ka o kwuru. Nꞌihi nke a gwasie ha okwu ike banyere mmehie ha na-atụghị ụjọ. Ọ bụ nanị nke a ga-enyere ha aka ibi ezi ndụ nꞌime okwukwe anyị.
14
Kwụsị ha ige ntị nꞌakụkọọ ifo ndị Juu na-akọ. Ekwekwala ka ha gee ntị nꞌiwu ahụ ndị jụrụ eziokwu ahụ na-enye ha.
15
Onye ọ bụla obi ya dị ọcha na-ahụ nanị ihe dị mma na ihe dị ọcha nꞌihe nile. Ma onye ahụ obi ya na-adịghị ọcha, nke na-adịghị atụkwasị onye ọ bụla obi, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ka ọ na-ahụ nꞌihe nile. Nꞌihi na obi ruru unyi, nke na-ekweghị ekwe, na-eme ka ihe nile ọ na-ahụ bụrụ nanị ihe rụrụ arụ.
16
Ọ bụ ezie na ndị dị otu a na-asị na ha maara Chineke ma e lee anya nꞌomume ha, ọ na-ezipụta na ha amaghị ya. Ha bụ ndị ọjọọ, ndị rere ure na ndụ ha, ndị na-adịghị ekwenye nꞌihe ọ bụla gbasara Chineke, ndị na-enweghị ike ịrụpụta ezi ọrụ ọ bụla na ndụ ha.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3