bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Titus 3
Titus 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
1
Chetara ndị gị mkpa ọ dị ido onwe ha nꞌokpuru ọchịchị gọomenti na nꞌokpuru ndị na-achị achị. Ka ha naerubere ha isi, bụrụkwa ndị ọ na-agụ agụụ ime ezi ihe.
2
Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọ bụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama ka ha bụrụ enyi mmadụ nile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nꞌebe mmadụ nile nọ.
3
Nꞌihi na mbụ, anyị bụ ndị nzuzu, ndị na-enupụ isi, na ndị na-enweghị uche. Anyị bụ ohu agụụ ihe ọjọọ na ihe ụtọ dị iche iche. Anyị biri ndụ obi ọjọọ, na ekworo, na ịkpọrịta onwe anyị asị.
4
Ma mgbe ịhụnanya na obi ọma Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ìhè,
5
ọ zọpụtara anyị. Ma ọ zọpụtaghị anyị nꞌihi ọrụ ọma anyị rụrụ, kama ọ zọpụtara anyị nanị site nꞌobi ebere ya na ọmiko ya. Ọ sachapụrụ mmehie anyị, nyekwa anyị ọṅụ ọhụrụ nke ya na Mmụọ Nsọ bi nꞌime anyị so.
6
O sitere nꞌịba ụba nke ebere ya wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ ya nꞌihi ihe ahụ nile Jisọs Kraịst Onye nzọpụta anyị mere.
7
O sitekwara nꞌobi ebere ya dị ukwuu gụọ anyị na ndị ga-eketa oke na ndụ ebighị ebi ahụ ọ na-enye. Anyị naelekwa anya ọbịbịa oge ahụ anyị gaanata ya.
8
Ihe ndị a m kwuru nꞌebe a bụ eziokwu. Achọrọ m ka okwu ndị a dị gị nꞌọnụ mgbe nile, meekwa ka o doo ndị gị anya. Ọ bụ ya ga-eme ka ndị nile kweere na Chineke kpọọ ime ihe ọma mkpa. Nꞌihi na ezi ọrụ bara uru. Ọ na-ewetakwa ụgwọ ọrụ.
9
Etinyela onwe gị nꞌọnọdụ ịrụ ụka ọ bụla. Atụfula oge ịrụ ụka banyere ajụjụ na-enweghị ọsịsa ma ọ bụ ajụjụ gbasara usoro ọmụmụ. Wezụga onwe gị nꞌịrụ ụka na-eweta esomokwu dị ka ajụjụ banyere idebe iwu ndị Juu, nꞌihi na ihe ndị a abaghị uru.
10
Dọọ onye ọ bụla na-eweta ọgba aghara nꞌetiti unu aka na ntị ugboro abụọ. Ọ bụrụ na ọ jụ ịnabata ndụmọdụ gị, gị na ya enwekọkwala ihe ọ bụla ọzọ.
11
Nꞌihi na ọgụgụ isi onye dị otu a bụ ọgụgụ isi ime ihe ọjọọ. Ọ bụ onye na-eme mmehie, ọ matakwara na ọ na-eme ya.
12
Biko, ana m akwado izitere gị Atemas ma ọ bụ Tikikọs. Mgbe ọ bụla onye ọ bụla nꞌime ha bịaruru, gbalịsie ike bịa hụ m nꞌobodo Nikopolis, nꞌihi na ọ bụ nꞌobodo a ka m kpebiri ịnọ nꞌoge oyi.
13
Hụ na ị gbalịsịrị ike inyere Zenal okpe ikpe na Apọlọs aka mgbe ha malitere njem ha. Hụkwa na ha nwetara ihe nile ha chọrọ maka njem a.
14
Nꞌihi na ọ dị mkpa ka ndị anyị mụta inyere ndị nile chọrọ enyemaka ha aka. Ọ bụ nke a ga-eme ka ha bụrụ ndị na-amị mkpụrụ.
15
Ndị nile mụ na ha nọ nꞌebe naekele gị. Keleekwara anyị ndị enyi nile, bụ ndị kwere ekwe. Ka amara dịnyere unu nile.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
All chapters:
1
2
3
Recommended Reading
Commentary
Titus Commentaries
→
Devotional
Titus Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→