bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Corinthians 5
1 Corinthians 5
Igbo 2006
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 6 →
1
Anānu nọ̄ na ikwa-iko di n'etiti unu, aha ikwa-iko nke nādighi kwa ọbuná n'etiti ndi mba ọzọ, nke mere na otú onye n'etiti unu nwere nwunye nna-ya.
2
Unu onwe-unu afuliwo kwa onwe-unu elu, unu erughi kwa újú kama nke ahu, ka ewe wepu onye ahu n'etiti unu, bú onye luru ọlu a.
3
N'ihi na mu onwem n'ezie, ebe m'nānọghi n'etiti unu n'arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, ekpewom onye ahu nke lutara nka otú a ikpé ọbuná ub͕u a, dika agāsi na anọm,
4
n'aha nke Onye-nwe-ayi Jisus, mb͕e unu zukọrọ, mọm nēso kwa unu, ya na ike nke Onye-nwe-ayi Jisus,
5
irara onye di otú a nye n'aka Setan ibibi anu-aru-ya, ka ewe zọputa mọ-ya n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus.
6
Ihe-inya-isi-unu adighi nma. Ùnu amataghi na ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum?
7
Sachapunu ihe-iko-achicha ochie, ka unu we buru ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ ọhu, dika unu bu achicha ekoghi-eko. N'ihi na achu-kwa-ra àjà-ngabiga-ayi, bú Kraist:
8
ya mere, ka ayi nēme ememe ahu, ọ bughi n'ihe-iko-achicha ochie, ọ bughi kwa n'ihe-iko-achicha nke bu obi ọjọ na ajọ ọlu, kama n'achicha ekoghi-eko nke bu idi-ọcha na ezi-okwu.
9
Edegaram unu n'akwukwọ-ozim ka unu na ndi nākwa iko ghara imekọ ihe;
10
ọ bughi ndi nke uwa nka ndi nākwa iko ma-ọli, ma-ọbu ndi-anya-uku-ya na ndi nāpunara madu ihe, ma-ọbu ndi nēkpere arusi: ebe ọ gādi unu nkpà isi n'uwa pua ma asi na unu eme otú a:
11
ma otú ọ di, edegaram unu ka unu na onye ọ bula nke anākpọ ya aha na ọ bu nwa-nna ghara imekọ ihe, ma ọ buru na onye ahu bu onye nākwa iko, ma-ọbu onye-anya-uku, ma-ọbu onye nēkpere arusi, ma-ọbu onye-nkwutọ, ma-ọbu onye nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu onye nāpunara madu ihe; ka unu na onye di otú a ghara ọbuná irikọ ihe.
12
N'ihi na òle ihe bu nkem ikpe ndi nọ n'èzí ikpé? Ọ̀ bughi ndi nọ n'ime ka unu onwe-unu nēkpe?
13
ma Chineke nēkpe ndi nọ n'èzí ikpé. Wepunu ajọ onye ahu n'etiti onwe-unu.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16