bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Corinthians 6
1 Corinthians 6
Igbo 2006
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 7 →
1
Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu, ma asi na o nwere okwu megide ibe-ya, nwere anya-ike ije ikpé n'iru ndi ajọ omume, ma ọ bughi n'iru ndi nsọ?
2
Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi nsọ gēkpe uwa ikpé? ọ buru kwa na agaje ikpe uwa n'iru unu, ùnu ekwesighi inọ dika ndi-ikpé n'ulo-ikpé dikarisiri ntà?
3
Ùnu amataghi na ayi gēkpe ndi-mọ-ozi ikpé? àyi gēsi aṅa ghara inwe ike ikpe ihe nke ndu a?
4
Ya mere asi na unu nwere ulo-ikpé diri ndu a n'ezie, menu ka ndi ahu nọdu dika ndi-ikpé, bú ndi anākpọ ihe-efu n'etiti nzukọ Kraist.
5
Anamekwu nka ka m'me unu ihe-ihere n'iru. Ọ̀ di otú a, na ọ dighi otù onye mara ihe nọ n'etiti unu, onye gāpu ikpe ikpé n'etiti nwa-nna-ya na ibe-ya,
6
kama nwa-nna nēwere nwa-nna-ya je ikpé, nka bu kwa n'iru ndi nēkweghi ekwe?
7
Ezie ọ bu nọ̄ ila-ala n'ebe unu nọ ọbuná ub͕u a, na unu nwere okwu ikpé n'etiti onwe-unu. Kari nke ahu, n'ìhi gini unu adighi-ekwe ka emegide unu ajọ omume? kari nke ahu, n'ìhi gini unu adighi-ekwe ka emeb͕ue unu?
8
É-è, kama unu onwe-unu nēme ajọ omume, nēmeb͕u kwa, nka ka unu nēme kwa umu-nna-unu.
9
Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom,
10
ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.
11
Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.
12
Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nābaram urù. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ dighi ihe ọ bula gāchi mu onwem.
13
Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi:
14
ma Chineke mere ka Onye-nwe-ayi si n'ọnwu bilie, Ọ gēsite kwa n'ike-Ya me ka ayi onwe-ayi si n'ọnwu bilie.
15
Ùnu amataghi na aru-unu bu ihe di n'aru Kraist? #m'gēwepu kwa ihe di n'aru Kraist, me ha ka ha buru ihe di n'aru nwanyi nākwa iko? Chineke ekwela.
16
Ma-ọbu ùnu amataghi na onye nārapara n'aru nwanyi nke nākwa iko, ya na ya bu otù aru? n'ihi na, Ha abua ka O kwuru, gāghọ otù anu-aru.
17
Ma onye nārapara n'aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ.
18
B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya.
19
Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;
20
n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16