bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ecclesiastes 1
Ecclesiastes 1
Igbo 2006
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 2 →
1
Okwu nke Onye-nkpọkọta, bú nwa Devid, bú eze nime Jerusalem.
2
Ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ka Onye-nkpọkọta siri; ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ihe nile bu ihe-efu.
3
Òle ihe fọduru madu nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu n'okpuru anyanwu?
4
Otù ọgbọ alá, ọb͕ọ ọzọ abia; ma uwa nēguzoru mb͕e ebighi-ebi.
5
Ọzọ, anyanwu awawo, anyanwu adawo kwa, ọ bu kwa ila n'ọnọdu-ya ka ọ nēkusi ume ike, bú ebe ọ nāwa.
6
Ifufe nēferu Ndida, we nēfe buruburu rue Ugwu; ọ nēfe buruburu mb͕e nile na nfeghari-ya, ọ bu kwa n'ife buruburu ya ka ifufe feghachiworo.
7
Osimiri nile nērùdaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughi eju, rue ebe osimiri nērùda, rue ebe ahu ka osimiri ahu nērùghachi ọzọ.
8
Ihe nile nādọb͕u onwe-ha n'ọlu; madu apughi ikwu ya: afọ adighi-eju anya n'ihu ihe, afọ adighi-eju kwa nti n'inu ihe.
9
Ihe ọ bula nke diworo, nke ahu bu ihe nke gādi; ọzọ, ihe ọ bula nke emeworo, nke ahu bu ihe nke agēme: ọ dighi kwa ihe ọhu di n'okpuru anyanwu.
10
Ọ̀ di ihe nke madu nāsi, Le nka, ihe ọhu ka ọ bu? na mb͕e di anya gara aga ka ọ diworo, na mb͕e nile ebighi-ebi nke buru ayi uzọ.
11
Ọ dighi ncheta diri ọb͕ọ mbu nile: ọzọ kwa, ọ dighi ncheta gādiri ọb͕ọ ikpe-azu nile nke gādi n'ọdi-n'iru, n'etiti ndi nādi mb͕e ha gasiri.
12
Mu onwem, bú Onye-nkpọkọta, abuwo eze Israel nime Jerusalem.
13
M'were kwa obim nye ichọ na iledo site n'amam-ihe ihe bayere ihe nile nke emeworo n'okpuru elu-igwe: nke ahu bu nweda-n'ala jọrọ njọ nke Chineke nyeworo umu nke madu ka ewere ya weda ha n'ala.
14
Ahuwom ọlu nile nke aluworo n'okpuru anyanwu; ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.
15
Ihe nke b͕agọrọ ab͕agọ, apughi ime ka ọ dizie: ọzọ, ihe-nkọnari, apughi iguta ya.
16
Mu onwem kpayere obim uka, si, Mu onwem, le, atukwasiwom n'onwem amam-ihe nke-uku kari onye ọ bula nke burum uzọ nime Jerusalem: e, obim ahuwo amam-ihe na ihe-ọmuma ri nne.
17
M'we were obim nye ima amam-ihe, na ima iwi-ara na nzuzu: amawom na nka bu kwa ichọ ijide ifufe.
18
N'ihi na ọ bu n'ọtutu amam-ihe ka ọtutu nkpasu-iwe di: ọzọ, onye nātukwasi ihe-ọmuma nātukwasi ihe-nb͕u.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12