bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ecclesiastes 10
Ecclesiastes 10
Igbo 2006
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 11 →
1
Ijiji nwuru anwu nēme ka manu onye nāsugwa manu-otite nke nēsì ísì utọ sìe ísì ọjọ, re kwa ure: otú a ka nzuzu ntà di arọ́ kari amam-ihe, kari kwa nsọpuru.
2
Obi onye mara ihe di n'aka-nri-ya; ma obi onye-nzuzu di n'aka-ekpe-ya.
3
Ọzọ kwa, mb͕e onye-nzuzu nēje ije n'uzọ, obi-amam-ihe-ya nākọnari ya, ọ we si madu nile na onye-nzuzu ka ọ bu.
4
Ọ buru na mọ nke onye nāchi achi ebilie imegide gi, arapula ọnọdu-gi; n'ihi na ime-nwayọ nēme ka nmehie uku di iche iche kwusi.
5
Ihe ọjọ di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, ọ di ka ihe emere n'amaghi-ama nke nēsi n'aka onye nāchi achi aputa:
6
etiyere nzuzu n'ebe di iche iche di elu ri nne, ma ndi-ọgaranya nānọdu n'ebe di ala.
7
Ahuwom ndi-orù ka ha nānọkwasi n'inyinya, ahuwokwam ndi-isi ka ha nējeghari dika ndi-orù n'elu uwa.
8
Onye nēgwu olulu, nime ya ka ọ gādabà; ọzọ, onye nētipú mb͕idi, agwọ gāta ya aru.
9
Onye nēbupu nkume, o gēb͕u ya nb͕u site na ha; onye nāwa osisi nọ n'ize-ndu site na ya.
10
Ọ buru na ígwè anyua nkọ, ma onye ahu amughi iru-ya amu, ọ gētiye kwa ike kari: ma amam-ihe nāba urù ime ka ihe nāgazi agazi.
11
Ọ buru na agwọ ata aru tutu arà ya urà, ọ dighi kwa urù ọ gābara onye-nwe ire-utọ.
12
Okwu nile nke ọnu onye mara ihe di amara; ma eb͕ub͕ere-ọnu nke onye-nzuzu gēloda ya onwe-ya.
13
Nmalite okwu nile nke ọnu-ya bu nzuzu: nkwubì okwu-ọnu-ya bu kwa iwi-ara ọjọ.
14
Onye-nzuzu nēme kwa ka okwu ba uba: madu adighi-ama ihe ọ bula nke gādi adi; ọzọ, ihe gādi mb͕e ọ gasiri, ònye gēgosi ya?
15
Ndọb͕u nke ndi-nzuzu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nāgwu onye ọ bula nime ha ike, n'ihi na ọ maghi ijeru obodo.
16
Ahuhu gādiri gi, ala, mb͕e eze-gi bu nwata, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe n'ututu!
17
Ihe nāgara gi nke-ọma, ala, mb͕e eze-gi bu nwa ndi amara aha-ha, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe na mb͕e oriri, n'ihi idi-ike, ọ bughi kwa n'ihi iṅubiga-manya-ókè!
18
Site n'okè ume-ngwu ka elu ulo nēze eze; site kwa n'ifanye aka n'ukwu ka ulo nēhi mmiri.
19
N'ihi ichì-ọchì ka anēsi nri, manya-vine nēme ka ndu ṅuria: ego nāza kwa ihe nile.
20
Ọbuná n'uche-gi akọchala eze; akọcha-kwa-la ọgaranya n'ime-ulo-ndina-gi: n'ihi na anu-ufe nke elu-igwe gēme ka olu-gi rue ya nti, ihe nwere nkù gēgosi kwa okwu ahu.
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 11 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12