bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezra 1
Ezra 1
Igbo 2006
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 2 →
1
Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Peasia, ka okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia we rè, Jehova kpọtere mọ nke Sairọs, bú eze Peasia, o we kwusa n'ala-eze-ya nile, ọzọ kwa, o tiyere ya n'odide-akwukwọ, si,
2
Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m'buru onye-nlekọta n'iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda.
3
Ònye nọ n'etiti unu site na ndi-Ya nile? ka Chineke-ya nọyere ya, ya rigoru kwa Jerusalem, wue ulo Jehova, bú Chineke Israel, (Ya onwe-ya bu Chineke,) nke di na Jerusalem.
4
Ma onye ọ bula nke fọduru afọdu, site n'ebe nile ebe onye ahu nọ dika ọbìa, ka ndikom nke ebe-ya were ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo, ya na onyinye-afọ-ofufo-ha nke diri ulo Chineke nke di na Jerusalem, yere ya aka.
5
Ndi-isi ulo nke ndi bu nna Juda na Benjamin, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, bú onye ọ bula Chineke kpọtere mọ-ya, we bilie irigo iwu ulo Jehova nke di na Jerusalem.
6
Ndi nile nke nọ ha buruburu we were ihe ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo na ihe di oké ọnu-ahia, nāgughi ihe nile enyere n'afọ-ofufo, me ka aka-ha di ike.
7
Eze, bú Sairọs, chiputa-kwa-ra ihe ulo Jehova, nke Nebukadneza chipuru na Jerusalem tiye n'ulo ndi-chi-ya:
8
Sairọs, bú eze Peasia, we chiputa ha site n'aka Mitredat, bú odozi-àkù, gua ha nye Sheshbaza, bú onye-isi Juda.
9
Nka bu kwa ọnu-ọgugu-ha: orú ọkwa ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ọla-ọcha abua na ọgu iri, na orú mma na iteghete;
10
orú ọkwa ntà ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ntà ọla-ọcha na iri nke-abua di iche, na nnù ihe ọzọ abua na ọgu iri.
11
Ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha di nnù iri-na-atọ na ọgu iri. Ha nile ka, Sheshbaza chigotara, mb͕e ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ siri na Babilon rigorue Jerusalem.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10