bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezra 3
Ezra 3
Igbo 2006
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 4 →
1
Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n'obodo nile ha, ndi ahu we chikọta onwe-ha dika otù onye rue Jerusalem.
2
Jeshua nwa Jozadak, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, na Zerubabel nwa Shealtiel, na umu-nne-ya, we bilie, wue ebe-ichu-àjà Chineke Israel, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, dika edeworo ya n'iwu Moses, bú onye nke Chineke.
3
Ha we me ka ebe-ichu-àjà guzosie ike n'ebe-ndọkwasi-ya nile; nihi na oké ujọ di n'aru ha n'ihi ndi ala ahu nile: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, bú àjà-nsure-ọku anēsure ututu na anyasi.
4
Ha we me ememe ulo-ntu, dika edeworo ya, ha we chua àjà-nsure-ọku nke ubọchi n'ubọchi-ha n'ọnu-ọgugu, dika ikpé si di, bú ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya;
5
mb͕e ihe a gasiri ha we chua àjà-nsure-ọku nke mb͕e nile, na nke diri ọnwa ọhu, na nke diri mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú nke edoro nsọ, na nke diri onye ọ bula nke nēwere afọ-ofufo nye Jehova onyinye-afọ-ofufo.
6
Site n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa ka ha malitere isurere Jehova àjà-nsure-ọku: ma akātọghi ntọ-ala ulo uku Jehova.
7
Ha nye kwa ndi nāwa nkume, nye kwa ndi-ọ̀kà n'osisi, ego; ha nye kwa ndi Zaidon, nye kwa ndi Taia, ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na manu, ka ha we si na Lebanon bute osisi cedar rue oké osimiri, rue Jafo, dika nkwenye nke Sairọs, bú eze Peasia, kweyere ha.
8
Ma n'arọ nke-abua nke ọbibia-ha nke ha biaruru ulo Chineke nime Jerusalem, n'ọnwa nke-abua, ha malitere, bú Zerubabel nwa Shealitiel, na Jeshua nwa Jozadak, na ndi fọduru n'umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi nile ndi nēsi na ndọta-n'agha ahu bia na Jerusalem; ha we guzo ndi Livai, site n'onye b͕ara orú arọ ga n'iru, ibu ndi-isi n'ije-ozi nke ulo Jehova.
9
Jeshua we guzo, ya na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, na Kadmiel na umu-ya ndikom, bú umu Juda, dika otù onye, ibu ndi-isi nke ndi nēje ozi ahu n'ulo Chineke: umu-ndikom Henadad na umu-ha ndikom ṅa umu-nne-ha, bú ndi Livai.
10
Ma mb͕e ndi nēwu ulo tọrọ ntọ-ala ulo no, uku Jehova, ha we guzo ndi-nchu-àjà n'uwe-ha chiri opì, na ndi Livai, bú umu Esaf, chiri ájà, ito Jehova, dika ukpuru Devid, bú eze Israel, si di.
11
Ha we zarita onwe-ha n'ito na n'ikele Jehova, si, N'ihi na Ọ di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di n'ebe Israel nọ. Ndi Israel nile we tie oké nkpu, mb͕e ha toro Jehova, n'ihi na atọrọ ntọ-ala ulo Jehova.
12
Ma ọtutu nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-okenye ndi huru ulo mbu, mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo a n'anya-ha, ha nākwa ákwá n'oké olu; ọtutu nọ kwa n'iti nkpu n'ọṅù, nēweli olu-ha:
13
ndi Israel amataghi kwa ihe bu olu iti-nkpu ọṅù na nke bu olu ikwa-ákwá ndi Israel: n'ihi na ndi Israel nēti oké nkpu, ewe nu olu-ya rue ebe di anya.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10