bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Hosea 1
Hosea 1
Igbo 2006
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 2 →
1
Okwu Jehova nke ruru Hosea nwa Beeri nti n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel.
2
Isi-nmalite nke ikwu-okwu Jehova n'ọnu Hosea. Jehova we si Hosea, Je, luru n'onwe-gi nwunye nke nākwa iko na umu amuru n'ikwa-iko: n'ihi na ala nka nākwa iko nke-uku, ghara iso Jehova.
3
O we je luru Gomea nwa-nwayi Diblaim; owe turu ime, mutara ya nwa-nwoke.
4
Jehova we si ya, Kpọ aha-ya Jezreel; n'ihi na ọ fọduru nwa mb͕e ntà, M'gēwere ọbara Jezreel leta ulo Jihu, M'gēme kwa ka ala-eze ulo Israel kwusi.
5
Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gāb͕aji uta Israel nime ndagwurugwu Jezreel.
6
O we turu ime ọzọ, mua nwa-nwanyi. Jehova we si Hosea, Kpọ aha-ya Lo-ruhama: n'ihi na M'gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru ulo Israel ọzọ, ka M'we bupuru ha nmehie-ha ma-ọli.
7
Ma n'aru ulo Juda ka M'gēnwe obi-ebere, M'gēji kwa Jehova, bú Chineke-ha, zọputa ha, ma M'gaghi-eji uta, ma-ọbu mma-agha, ma-ọbu agha, ma-ọbu inyinya, ma-ọbu ndi-inyinya, zọputa ha.
8
O we me ka Lo-ruhama rapu ara, o we turu ime, mua nwa-nwoke.
9
Jehova we si, Kpọ aha-ya Lo-ami: n'ihi na unu onwe-unu abughi ndim, Mu onwem agaghi-abu-kwa-ra unu Chineke.
10
Ma ọnu-ọgugu umu Israel gādi ka ájá oké osimiri, nke anāgagh ātùta, nke anāgaghi-agu kwa ọnu; ọ gēru kwa na, n'ebe ahu nke anāsi ha, Ọ bughi ndim ka unu bu, n'ebe ahu ka agāsi ha, Umu Chineke di ndu ka unu bu.
11
Agāchikọta kwa umu Juda na umu Israel, ha gēdo-kwa-ra onwe-ha otù onye-isi, si n'ala-ha rigopu, n'ihi na ihe uku ka ubọchi Jezreel bu.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14