bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Hosea 7
Hosea 7
Igbo 2006
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 8 →
1
Mb͕e M'gāgwọ Israel, mb͕e ahu ka ekpughere ajọ omume Efraim, na ihe ọjọ nile nke Sameria; n'ihi na ha aluwo ọlu ugha: ọzọ, onye-ori nābà n'ulo, usu ndi nāpunara madu ihe amadewo kwa n'èzí.
2
Ma ha adighi-asi n'obi-ha na ọ bu ihe ọjọ nile ha ka M'chetaworo: ub͕u a ka omume nile ha b͕aworo ha buruburu; na ncherita-irum ka ha di.
3
Ha ji ihe ọjọ ha eme ka eze ṅuria, ji kwa okwu-ugha nile ha eme ka ndi-isi ṅuria.
4
Ha nile bu ndi nākwa iko; ha di ka ite-ọku uku nke osi-ite meworo ka ọ di ọku; ọ kwusiri ikpọnwu site na mb͕e edoziri utu ọka flour agwọrọ agwọ rue mb͕e emere ka o ko eko.
5
N'ubọchi eze-ayi ndi-isi jiri idi-ọku nke manya-vine ria ọria; o soro ndi nākwa emò setia aka-ya.
6
N'ihi na ha ebutewo obi-ha nso dika ite-ọku uku, mb͕e ha nēche anwu: ogologo abali nile ka osi-ite-ha nāraru ura; n'ututu ihe ahu nēre dika ọku nēnwu enwu.
7
Ha nile di ọku ka ite-ọku uku, ha ewe ripia ndi-ikpe-ha; ndi-eze nile ha adawo n'ala: ọ dighi onye nākpọkum n'etiti ha.
8
Efraim, n'etiti ndi nile di iche iche ka ya onwe-ya nāgwa onwe-ya ọgwa; Efraim aghọwo ob͕e achicha nke anātugharighi atughari.
9
Ndi ala ọzọ eripiawo ike-ya, ma ya onwe-ya amagh: e, efesawo ya isi-awọ, ma ya onwe-ya amaghi.
10
Npako Israel azawo kwa okwu n'iru ya: ma ha alaghachikuteghi Jehova, bú Chineke-ha, ha achọtaghi kwa Ya, n'ihe a nile.
11
Efraim we di ka nduru nēnweghi uche, ọ dighi obi amam-ihe o nwere: Ijipt ka ha kpọkuworo, Asiria ka ha jekuworo.
12
Mb͕e ha nēje M'gāb͕asa ub͕um n'aru ha; dika anu-ufe nke elu-igwe ka M'gēme ka ha rida: M'gādọ ha aka na nti, dika ihe nzukọ-ha nuworo.
13
Ahuhu diri ha! n'ihi na ha awafunariwom; nbibi diri ha! n'ihi na ha ejehiewo megidem: ọ bu ezie na Mu onwem nāb͕aputa ha, ma ha onwe-ha ekwuwo okwu-ugha di iche iche megidem.
14
Ha ejighi kwa obi-ha tikuem, kama ha nākwasi ákwá ike n'elu ihe-ndina-ha: n'ihi ọka na manya-vine ọhu ka ha nāchikọta onwe-ha, ha nēwezuga onwe-ha imegidem.
15
Ọ bu ezie na Mu onwem adọwo ha aka na nti, me ka ogwe-aka-ha di ike, ma Mu ka ha nēchè ihe ọjọ megide.
16
Ha nālaghachi, ma ọ bughi Onye nọ n'elu ka ha nālaghachikute; ha di ka uta nāghọ aghughọ: ndi-isi-ha gāda site na mma-agha, site n'oké iwe nke ire-ha: nka bu ikwa-emò-ha n'ala Ijipt.
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14