bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Jeremiah 26
Jeremiah 26
Igbo 2006
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 27 →
1
Na nmalite nke ọbubu-eze Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, ka okwu a sitere na Jehova, si,
2
Otú a ka Jehova siri: Guzo n'ogige ulo Jehova, gwa obodo nile nke Juda, bú ndi nābia ikpọ isi ala n'ulo Jehova, okwu nile nke M'nyere gi n'iwu igwa ha; agubìla otù nime ha.
3
Eleghi anya ha gānu, we lata, onye ọ bula o si n'uzọ ọjọ ya lata; ka M'we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēchè ime ha n'ihi ihe ọjọ nke omume nile ha.
4
I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na unu egeghm nti, ijehari n'iwum nke M'tiyeworo n'iru unu,
5
ige nti okwu nile nke ndi-orùm, bú ndi-amuma, ndi Mu onwem nēzitere unu, nēbili kwa n'isi-ututu nēzite ha, ma unu egeghi nti;
6
M'gēme kwa ka ulo a di ka Shailo, ọ bu kwa obodo a ka M'gēme ka ọ ghọrọ mba nile nke uwa ihe-nkọcha.
7
Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile we nu ka Jeremaia nēkwu okwu ndia n'ulo Jehova.
8
O rue, mb͕e Jeremaia kwubìri okwu nile nke Jehova nyere ya n'iwu igwa ndi Israel nile, na ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile jidere ya, si, I ghaghi inwu anwu.
9
Gini mere i buworo amuma n'aha Jehova, si, Ulo a gādi ka Shailo, obodo a gābu kwa nkpọnkpọ ebe, ghara inwe onye-obibi? Ewe kpọkọta ndi Israel nile n'ebe Jeremaia nọ n'ulo Jehova.
10
Ndi-isi Juda we nu ihe ndia, ha we si n'ulo eze rigota n'ulo Jehova; ha we nọdu ala n'oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova.
11
Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma we gwa ndi-isi na ndi Israel nile okwu, si, Ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na o buwo amuma megide obodo a, dika unu jiworo nti-unu nu.
12
Jeremaia we gwa ndi-isi nile, gwa ndi Israel nile, okwu, si, Jehova ziterem ibu amuma okwu nile nke unu nuworo megide ulo a na imegide obodo a.
13
Ma ub͕u a menu ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma, ge-kwa-nu nti olu Jehova, bú Chineke-unu; Jehova gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke O kwuworo megide unu.
14
Ma mu onwem, le, adim n'aka-unu: menum ka o si di nma na ka o si zie ezie n'anya-unu.
15
Nání, maranu nke-ọma na, ọ buru na unu eme ka m'nwua, ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ ka unu onwe-unu nātukwasi n'aru unu, na n'aru obodo a, na n'aru ndi bi ya: n'ihi na n'ezi-okwu Jehova ezitewom ibiakute unu ikwu okwu ndia nile na nti-unu.
16
Ndi-isi na ndi Israel nile we si ndi-nchu-àjà, si kwa ndi-amuma, Ọ dighi ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na ọ bu n'aha Jehova, bú Chineke-ayi, ka gwaworo ayi okwu.
17
Ufọdu nime ndi-okenye ala we bilie, gwa nkpọkọta ahu nile nke ndi Israel okwu, si,
18
Maika onye Moreshet nēburi amuma n'ubọchi Hezekaia, bú eze Juda; o we gwa ndi Juda nile okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agēji ploughi gwu Zaion dika ubi, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.
19
Hezekaia, bú eze Juda, na Juda nile, hà mere ya ka ọ nwua ma-ọli? ọ̀ tughi egwu Jehova, we chọ ka iru Jehova dajua, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke O kwururi megide ha? Ma ayi onwe-ayi nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi-ayi.
20
Ọzọ kwa, otù nwoke di nke nēbu amuma n'aha Jehova, bú Uraia nwa Shemaia nke sitere na Kiriat-jearim; o we bue amuma megide obodo a, megide kwa ala nka, dika okwu nile nke Jeremaia si di:
21
Jehoiakim, bú eze, na ndi-dikei ya nile, na ndi-isi nile, we nu okwu-ya nile, eze we chọ ime ka ọ nwua; Uraia we nu ya, tua egwu, b͕alaga, we ba n'Ijipt:
22
Jehoiakim, bú eze, we ziga ndikom n'Ijipt, bú Elnetan nwa Akboa, na ndikom ufọdu so ya, ijeru Ijipt:
23
ha we me ka Uraia si n'Ijipt puta, ha we me ka ọ biakute eze, bú Jehoiakim; o we were mma-agha tibue ya, tubà ozu-ya n'ílì umu ndi Israel.
24
Ma otú ọ di, aka Ahaikam nwa Shefan di n'akuku Jeremaia, ka ha we ghara inye ya n'aka ndi Israel ime ka ọ nwua.
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 27 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50
51
52