bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Jeremiah 33
Jeremiah 33
Igbo 2006
← Chapter 32
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 34 →
1
Okwu Jehova we rue Jeremaia nti nke ub͕ò abua, mb͕e ya onwe-ya nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, si,
2
Otú a ka Jehova, bú Onye nēme ya, Jehova, bú Onye nākpu ya ime ka o guzosie ike, Onye Jehova bu aha-Ya, siri:
3
Kpọkuem, na M'gāza gi, gosi kwa gi ihe uku di iche iche, nke di kwa ike ighọta, nke i nāmaghi.
4
N'ihi na okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere ulo nile nke obodo a, baye-kwa-ra ulo nile nke ndi-eze Juda, nke akwadaworo imegide obo-ihe nile atuliri atuli na imegide mma-agha, si:
5
Ha nābia ibuso ndi Kaldea agha, na imeju ha n'ozu madu ndi M'tib͕uworo n'iwem na n'ọnumam, ndi M'zonariwo-kwa-ra obodo a irum n'ihi ihe ọjọ nile ha.
6
Le, M'gaje ime ka anu-aru ọhu puchie n'aru ya, ya na ngwọta, M'gāgwọta kwa ha; M'gēkpughe-kwa-ra ha nbabiga-ókè nke udo na ezi-okwu.
7
M'gēme kwa ka ndi Juda adọtara n'agha na ndi Israel adọtara n'agha lata, M'gēwu kwa ha dika ulo, dika na mbu.
8
M'gēme kwa ka ha si n'ajọ omume nile ha, bú nke ha mehieworo megidem, di ọcha; M'gāb͕aghara kwa ha ajọ omume-ha nile nke ha mehieworo megidem, na nke ha jehieworo megidem n'ime ha.
9
Obodo a gāghọ-kwa-ram aha obi-utọ, na otuto, na ima-nma, diri mba nile nke uwa, ndi gānu ezi ihe ahu nile nke Mu onwem nēmere ha, ndi gātu kwa oké egwu ma jijiji n'ihi ezi ihe ahu nile na n'ihi udo ahu nile nke Mu onwem nēmere ya.
10
Otú a ka Jehova siri: Agānu kwa ọzọ n'ebe a, nke unu onwe-ūnu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, ọbuná n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem, nke bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, nke ọ n'adighi madu, ọ nādighi kwa onye-obibi, ọ nādighi kwa anumanu, nēbi nime ha,
11
agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
12
Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: N'ebe a, nke bu nkpọnkpọ ebe, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, na n'obodo-ya nile, ka ebe-obibi nke ndi-ọzùzù-aturu ndi nēme ka ìgwè ewu na aturu-ha makpu gādi kwa ọzọ.
13
N'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb, na n'ala Benjamin, na n'ebe nile nke di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, ka ìgwè ewu na aturu gāgabiga kwa ọzọ n'okpuru aka abua nke onye nāgu ha ọnu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
14
Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka ezi okwu ahu guzosie ike, bú nke M'gwaworo ulo Israel, nke M'kwuwo-kwa-ra bayere ulo Juda.
15
N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, ka M'gēme ka Ihe-opupú nke ezi omume puere Devid; ọ gēme kwa ihe ekpere n'ikpe na ezi omume n'ala nka.
16
N'ubọchi ahu ka agāzọputa Juda, Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha nke agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi.
17
N'ihi na otú a ka Jehova siri: Agaghi-ebipu n'ulo Devid onye nwe inọkwasi n'oche-eze ulo Israel;
18
ọzọ, agaghi-ebipu n'ulo ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, n'irum onye nwe isure àjà-nsure-ọku, na isure onyinye-inata-iru-ọma dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì, utọ, na ichu àjà ubọchi nile.
19
Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,
20
Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na unu gēmebi ọb͕ub͕a-ndum nke ehihie, na ọb͕ub͕a-ndum nke abali, ka ehihie na abali we ghara id i na mb͕e-ha;
21
ya bu na agēmebi ọb͕ub͕a-ndum, nke Mu na Devid, bú orùm, b͕ara, ka o we ghara inwe nwa-nwoke nke bu eze n'elu oche-eze-ya; na ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi Livai, bú ndi-nchu-àjà, ndi nējerem ozi, b͕ara.
22
Otú agaghi-agu usu ihe di n'elu-igwe ọnu, na otú agaghi-atùta ájá nke oké osimiri; otú a ka M'gēme ka nkpuru Devid, bú orùm, na ndi Livai ndi nējerem ozi, ba uba.
23
Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,
24
Ì hughi ihe ndi nka kwuworo, si, Ab͕uru abua nke Jehova rọputara, Ọ juworo ha? ọ bu kwa ndim ka ha nēlelì anya, ha we ghara ibu kwa mba n'iru ha ọzọ.
25
Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na ọb͕ub͕a-ndum nke ehihie na abali adighi, ọ buru na atọghm ukpuru nile nke elu-igwe na uwa;
26
ya bu na M'gāju nkpuru Jekob, na Devid, bú orùm, M'we ghara isi na nkpuru-ya were ndi ganāchi nkpuru nke Abraham na Aisak na Jekob: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha.
← Chapter 32
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 34 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50
51
52
Recommended Reading
Commentary
Jeremiah Commentaries
→
Devotional
Jeremiah Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→