bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Jonah 1
Jonah 1
Igbo 2006
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 2 →
1
Okwu Jehova we rue Jona nwa Amitai nti, si,
2
Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku, ahu, kpọsa okwu megide ya; n'ihi na ihe ọjọ ha arigotawo n'irum.
3
Jona we bilie isi n'iru Jehova b͕alaga na Tashish, o we rida na Jafo, chọta ub͕ọ nke nēje Tashish: ọ we tua ùtú-ya, ba nime ya, iso ha biarue Tashish ipu n'iru Jehova.
4
Ma Jehova tubàra ifufe di uku n'oké osimiri, oke ifufe di uku we di n'oké osimiri, ewe chè na ub͕ọ gētiwa.
5
Ndi-ub͕ọ we tua egwu, we tikue, onye ọ bula chi-ya; ha we tufue ihe nile nke di n'ub͕ọ n'oké osimiri, ime ka ọ di kari nfe n'aru ha. Ma Jona ridarari n'ime-ime-ala ub͕ọ; o we dina ala, da n'oké ura.
6
Onye-isi nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ we biakute ya nso, si ya, Gini nēme gi, gi onye oké ura? bilie, kpọkue Chineke-gi, eleghi anya Chineke gēcheta ayi, ayi we ghara ila n'iyì.
7
Ha we sirita ibe-ha n'otù n'otù, Bianu, ka ayi fe nzà, ka ayi we mara n'ihi onye ihe ọjọ a ruworo ayi aru. Ha we fe nzà nzà we ma Jona.
8
Ha we si ya, Biko, gosi ayi n'ihi onye ihe ọjọ a ruworo ayi aru; òle ozi i nēje? ọ̀ bu kwa ole ebe i si bia? òle ala-gi? òle ndi i siri nime ha puta?
9
O we si ha, Onye-Hibru ka m'bu; ọ bu kwa Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, ka m'nātu egwu Ya, bú Onye mere oké osimiri na ala-akọrọ.
10
Ndikom ahu we tua oké egwu, si ya, Gini bu ihe a i meworo? N'ihi na ndikom ahu mara na ọ bu n'iru Jehova ka ọ nēsi b͕alaga, n'ihi na o gosiri ha-ri.
11
Ha we si ya, Gini ka ayi gēme gi, ka oké osimiri we dajua ghara imakwasi ayi? n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu.
12
O we si ha, Bulienum, tubàm n'oké osimiri; oké osimiri ewe dajua ghara imakwasi unu: n'ihi na mu onwem amawo na ọ bu n'ihim ka oké ifufe di uku a nēfekwasi unu.
13
Ma ndikom ahu we nyasie ike inyaghachi ub͕ọ n'ala; ma ha apugh: n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu megide ha.
14
Ha we kpọkue Jehova, si, Biko, Jehova, biko, ekwela ka ayi la n'iyì n'ihi ndu nwoke a, etiyekwasi-kwa-la n'isi ayi ọbara nēmeghi ihe ọjọ: n'ihi na Gi onwe-gi, bú Jehova, emewo dika o si tọ Gi.
15
Ha we bulie Jona, tubà ya n'oké osimiri: oké osimiri we guzo ọb͕ub͕ọ-ya.
16
Ndikom ahu we tua egwu Jehova nke-uku, ha we chuara Jehova àjà, kwe nkwa di iche iche.
17
Jehova we guputa otù azù uku ilo Jona; Jona we nọ n'afọ azù ahu ubọchi atọ ehihie na abali.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4