bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Jonah 2
Jonah 2
Igbo 2006
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 3 →
1
Jona we si n'afọ azù ahu kpere Jehova, bú Chineke-ya, ekpere.
2
O we si, Esirim n'ahuhum kpọkue Jehova, O we zam; N'afọ ala-mọ ka m'siri tikue Ya, I nuru olum.
3
N'ihi na I tubàram nime miri di omimi, n'etiti oké osimiri nile, Osimiri dikwam buruburu; Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile gabigara n'isim.
4
Mu onwem we si, Achupuwom n'iru anya-Gi abua; Otú ọ di, m'gēlegide kwa anya ọzọ n'ebe ulo uku Gi di nsọ di.
5
Miri b͕aram buruburu, rue nkpuru-obi; Ob͕u-miri dim buruburu; Achara-miri kukurum n'isi.
6
Rue ala ugwu nile ka m'ridara; Ala, ihe-ntuchi-ya nile kpachitaram rue mb͕e ebighi-ebi: Ma I mewo ka ndum si n'olùlù rigoputa, Jehova, bú Chinekem.
7
Mb͕e nkpuru-obim nēnweghi ike nimem, Jehova ka m'chetara: Ekperem we bakute Gi, ba n'ulo uku Gi di nsọ.
8
Ndi nāriba ihe-efu di iche iche nke nābughi ihe ama, Ebere-ha ka ha nārapu.
9
Ma mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà; Ihe nke m'kweworo na nkwa ka m'gākwughachi. Nzọputa diri Jehova.
10
Jehova we gwa azù ahu okwu, o we b͕ọputa Jona n'ala-akọrọ.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4