bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Judges 15
Judges 15
Igbo 2006
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 16 →
1
O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na mb͕e obìbì ọka wheat, na Samson were nwa-ewu leta nwunye-ya; ọ si, Ka m'bakuru nwunyem n'ime-ulo. Ma nna nwunye-ya ekweghi ka ọ ba.
2
Nna-ya we si, Asirim n'ezie na i kpọrọ ya asì nke-uku; m'we nye ya nwoke-ibe-gi: nwa-nne-ya nke-ntà, ọ̀ dighi nma kari ya? biko, ka ọ nọchiri gi n'ọnọdu ya.
3
Samson we si ha, Otù ub͕ò a m'gābu onye ikpe nāmaghi kari ndi Filistia, ọ bu ezie na mu onwem nēme ha ihe ọjọ.
4
Samson we je nwude ọgu nkita-ọhia iri-na-ise, chiri ọwa, che ọdudù iru, tiye otù ọwa n'etiti ọdudù abua n'ab͕ata ha.
5
Ọ we muye ọku n'ọwa nile, zipu ha ga n'ọka guzoro eguzo nke ndi Filistia, we sure ma obo ọka ma ọka guzoro eguzo, ha na ubi-olive.
6
Ndi Filistia we si, Ònye meworo nka? Ha si, Samson, di nwa onye Timna, n'ihi na ọ narawo ya nwunye-ya, nye ya nwoke-ibe-ya. Ndi Filistia we rigo, kpọre ya na nna-ya n'ọku.
7
Samson we si ha, Ọ buru na unu eme otú a, aghaghm ibọrọ onwem ọ́bọ n'aru unu, ma emesia m'gāgha.
8
O we tib͕ue ha ntib͕u uku, ogwe-ukwu n'elu apata-ukwu: ọ we rida, nọdu nime nb͕awa nke nkume di elu, bú Itam.
9
Ndi Filistia we rigo, ma ulo-ikwū-ha nime Juda, b͕asa onwe-ha nime Lehi.
10
Ndikom Juda we si, N'ìhi gini ka unu rigotaworo megide ayi? Ha si, Ike Samson ab͕u ka ayi rigotaworo, ime ya dika o meworo ayi.
11
Nnù ndikom Juda asa na ọgu iri we ridarue nb͕awa nkume di elu, bú Itam, si Samson, Ì maghi na ndi Filistia bu ndi nāchi ayi? gini bu kwa nka i meworo ayi? Ọ si ha, Dika ha merem, otú a ka m'meworo ha.
12
Ha si ya, Ike gi ab͕u ka ayi ridataworo, inye gi n'aka ndi Filistia. Samson we si ha, Ṅuaranum iyi, ka unu we ghara idakwasim, unu onwe-unu.
13
Ha we gwa ya okwu, si, É-è; kama ayi gēkesi gi ab͕u ike, nye gi n'aka-ha: ma ayi agaghi-eme ka i nwua ma-ọli. Ha we chiri udọ̀ ọhu abua ke ya ab͕u, me ka o si na nkume ahu di elu rigota.
14
Mb͕e ya onwe-ya biaruru Lehi, ndi Filistia we tie nkpu n'izute ya: Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, udọ̀ abua nke di n'ogwe-aka-ya abua we di ka flax nke reworo n'ọku, ab͕u-ya nile we b͕azepu n'aka-ya abua.
15
O we huta ọkpukpu-àb͕à ọhu nke inyinya-ibu, setipu aka-ya, jide ya, were ya tib͕ue nnù ndikom abua na ọgu iri.
16
Samson we si, Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo, otù obo, obo abua, Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo tib͕u nnù ndikom abua na ọgu iri.
17
O rue, mb͕e o kwubìri okwu, na ọ tupuru ọkpukpu-àb͕à-anu ahu n'aka-ya; o we kpọ ebe ahu Remat-lehi.
18
Akpiri we kpọ ya nku nke-uku, o we kpọkue Jehova, si, Gi onwe-gi esiwo n'aka orù-gi nye nzọputa uku a: ma ub͕u a m'gānwu n'akpiri-ikpọ-nku, dabà n'aka nke ndia anēbìghi úgwù.
19
Chineke we b͕awa olùlù ahu nke di nime Lehi, miri we si nime ya puta; o we ṅua, mọ-ya we biaghachi, o we di ndu; n'ihi ya ọ kpọrọ aha-ya En-hakore, nke di na Lehi, rue ta.
20
Ọ we kpe Israel ikpe na mb͕e ndi Filistia orú arọ.
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 16 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
Recommended Reading
Commentary
Judges Commentaries
→
Devotional
Judges Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→