bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Judges 5
Judges 5
Igbo 2006
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 6 →
1
Debora na Berak nwa Abinoam we bùa abù n'ubọchi ahu, si,
2
N'ihi na ndi-ndú nēdu edu n'Israel, N'ihi na ndi Israel were afọ-ofufo nye onwe-ha, Gọzienu Jehova.
3
Nurunu, ndi-eze; ṅanu nti, ndi-isi; Mu onwem gābùku Jehova abù, ọbuná mu onwem; M'gābùku Jehova, bú Chineke nke Israel, abù ọma.
4
Jehova, mb͕e I siri na Sia puta, Mb͕e I siri n'ọhia Edom zọ ije, Ala mara jijiji, elu-igwe bu-kwa-ra miri, Igwe-oji nile nke b͕ara ọchichiri bu-kwa-ra miri.
5
Ugwu nile rudara dika miri n'iru Jehova, Ọbuná Sainai ahu n'iru Jehova, bú Chineke nke Israel.
6
N'ubọchi Shamga nwa Anat, N'ubọchi Jael, okporo-uzọ nile ghara idi, Ndi nēje ije n'uzọ we je n'okporo-uzọ b͕agọrọ ab͕agọ.
7
Obodo ntà we ghara idi n'Israel, ha we ghara idi, Rue mb͕e mu, bú Debora, biliri, Rue mb͕e mu, bú nne n'Israel, biliri.
8
Ha rọputara chi ọhu di iche iche; Mb͕e ahu agha di n'ọnu-uzọ-ama nile: Àhuru ọta ma-ọbu ube N'etiti orú nnù madu uzọ ise n'Israel?
9
Obim di n'ebe ndi-ònyé-ukpuru nke Israel nọ, Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha n'etiti ndi Israel: Gọzienu Jehova.
10
Unu ndi inyinya-ibu ọcha nēbu, Ndi nānọkwasi n'uwe-nwuda, Unu na ndi nēje ije n'uzọ, Tugharinu uche.
11
N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri, N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova, Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel. Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile.
12
Teta, teta, Debora; Teta, teta, kwue okwu abù: Bilie, Berak, dọta usu ndi i dọtara n'agha n'agha, gi nwa Abinoam.
13
Mb͕e ahu ndi fọduru nime ndi di ike nke-uku, bú ndi Israel, ridara; Jehova ridara n'ihim imegide ndi-dike.
14
Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n'Efraim rida; Nēso gi n'azu, Benjamin, n'etiti umu-nna-gi. Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida, Ndi ji nka-n'aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida.
15
Ndi-isi n'Isaka nọye-kwa-ra Debora; Dika Isaka si di, otú a ka Berak di; Na ndagwurugwu ka ezigara ya n'ukwu-ya abua. Na miri-iyi nile nke Reuben Ka oké nzube obi di.
16
N'ìhi gini ka i nọduru n'etiti ogige-aturu-gi, Inu ob͕ub͕u-ọ̀jà anēb͕uru ìgwè aturu? Na miri-iyi nile nke Reuben Ka oké nnyocha obi di.
17
Gilead biri n'ofè Jọdan: Dan kwa, n'ìhi gini ka ọ nọ n'ub͕o? Asha nọduru n'ọnu-miri oké osimiri, Ọ bu kwa n'akuku ọwara-miri-ya nile ka o nēbi.
18
Zebulun bu ndi nyebigara ndu-ha rue ọnwu, Naftali kwa, n'elu ebe nile di elu nke ọhia.
19
Ndi-eze biara, bū agha; Mb͕e ahu ndi-eze Kenean būru agha, Nime Teanak n'akuku miri Megido: Ọ dighi urù ego ha nara.
20
N'elu-igwe ka ha si bū agha, Kpakpando si n'uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha.
21
Miri-iyi Kaishon bupuru ha, Miri-iyi ochie ahu, bú miri-iyi Kaishon. Nkpuru-obim, i nāzọda ike.
22
Mb͕e ahu ka ukwu inyinya zọsiri ike Site n'iwuli-elu ahu nile, bú iwuli-elu nke ihe nile ya di ike.
23
Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri, Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku; N'ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka, Iyere Jehova aka imegide ndi-dike.
24
Agāgọzi Jael kari ndinyom, Bú nwunye Heba onye-Kenait, Kari ndinyom n'ulo-ikwū ka agāgọzi ya.
25
Miri ka Sisera riọrọ, miri-ara-ehi ka ọ nyere ya; O weta nso ya miri-ara-ehi nke raru araru n'ọkwa ndi di ebube.
26
Aka-ya ka ọ setiri na ǹtú, Aka-nri-ya n'otùtù ndi nālu ọlu ike; O were otùtù kpọ Sisera, ọ kpọrọ ya n'isi, O we kpọpue ya, ǹtú ahu we bapue n'akuku egedege-iru-ya.
27
N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da, tọb͕ọ: N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da: Ebe o ruru ala, n'ebe ahu ka ọ dara, la n'iyì.
28
Na window-ya ka ọ lepuru anya, tie nkpu, Bú nne Sisera, site n'oghere inara ifufe, Gini mere ub͕o-ala-ya nānọ ọdù ibia? Gini mere wheel nke ub͕ọ-ala-ya nile ji la azu?
29
Ndi-isi-ya ndinyom ndi mara ihe nāza ya, E, ya onwe-ya nēkwughachiri onwe-ya okwu-ọnu-ya nile,
30
Hà achọtaghi? hà ekèghi ihe-nkwata? Otù nwa-ab͕ọghọ, umu-ab͕ọghọ abua, gādiri nwoke ọ bula, n'isi n'isi; Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji, diri Sisera, Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma, Bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma n'akuku abua, nke diri olu ndi akwatara?
31
Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n'iyi, Jehova: Ma ndi nāhu Ya n'anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n'ike-ya. Ala we di jū ọgu arọ abua.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21