bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Micah 2
Micah 2
Igbo 2006
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 3 →
1
Ahuhu diri ndi nēchèputa ajọ ihe, nālu kwa ihe ọjọ n'elu ihe-ndina-ha! n'ìhè nke ututu ka ha nēme ya, n'ihi na ọ di n'ike aka-ha.
2
Ha we tukwasi anya-uku n'ubi, nara ha n'ike; ha tukwasi anya-uku n'ulo, būru ha: ha emeb͕uwo kwa ma nwoke ma ulo-ya, bú onye ọ bula na ala-nketa-ya.
3
N'ihi nka ka Jehova siri otú a: Le, M'nēchè èchìchè ihe ọjọ megide ab͕uru nka, bú ihe ọjọ nke unu nāgaghi-ekopu olu-unu, unu agaghi-ejeghari kwa n'idi-elu; n'ihi na mb͕e ọjọ ka ọ bu.
4
N'ubọchi ahu ka agātu ilu megide unu, gosie ákwá ike, si: Apunarisiwo ayi ihe: òkè ndim ka Ọ nāb͕anwe: le ka O si ewepurum ya nke-uku! ọ bu onye nke nādaghachi azu ka Ọ nēkère ubi nile ayi.
5
N'ihi nka i gaghi-enwe onye nātu eriri-ọtùtù n'ala ruru madu n'ife-nzà nime nkpọkọta ndi Jehova.
6
Unu abusala okwu dika miri, otú a ka ha nābusa okwu. Ha agaghi-abusará ndia okwu: okwu-ha nke nētiye n'ọnọdu-ihere agaghi-ewezuga onwe-ha.
7
Gi ulo Jekob, àgāsi, Mọ nke Jehova, Ọ̀ rapuru ibu onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ? ihe ndia, hà bu omume-Ya? okwum nile, hà adighi-eme onye nējeghari n'ezi nma?
8
Ma nnyahuru ka ndim nēbili ọtọ ibu onye-iro: ọ bu n'uwe-nb͕okwasi ka unu nēyipucha uwe-nwuda n'aru ndi nāgabiga na ntukwasi-obi, bú ndi si n'agha echighari.
9
Ndinyom nke ndim ka unu nāchupu n'ulo ihe-utọ nile ha; umu-ntakiri-ha ka unu nānapu ebubem rue mb͕e ebighi-ebi.
10
Bilienu, la; n'ihi na nka abughi izu-ike-unu: n'ihi iru-árú nke nemebi emebi, ọbuná nmebi di irè.
11
Ọ buru na onye ọ bula nke nējeghari n'ifufe na okwu-ugha ekwu okwu-ugha, si, M'gābusara gi okwu dika miri bayere manya-vine, baye-kwa-ra ihe-ọṅuṅu nāba n'anya; ọ gābu kwa onye nābusara ndi nka okwu dika miri.
12
Gi Jekob, aghaghm ime ka ndi-gi nile zukọta; aghaghm ichikọta ndi Israel fọduru; n'otù ka M'gēdokọ ha dika ìgwè ewu na aturu nke Bọzra: dika ìgwè aturu n'etiti ebe-ita-nri-ya; ha gēme oké nkpọtu n'ihi uba madu.
13
Onye-ntipú ahu arigowo n'iru ha: ha etipúwo, we gabiga rue ọnu-uzọ-ama, pua na ya: eze-ha agabigawo kwa n'iru ha, Jehova kwa n'isi ha.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7