bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Micah 5
Micah 5
Igbo 2006
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 6 →
1
Ub͕u a ka i gēdo onwe-gi n'usu ndi nāpunara madu ihe, gi ada nke usu ndi nāpunara madu ihe: nnọchigide-n'agha ka ọ nọchigideworo ayi: ha gēji nkpa-n'aka tie onye-ikpe Israel na ǹtì.
2
Ma gi onwe-gi, Bet-lehem Efrata, nke di ntà idi n'etiti usu nile nke nnù abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n'Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mb͕e ochie, site n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.
3
N'ihi nka ka Ọ gārara ha nye, rue mb͕e nwanyi ime nēme gāmuwori nwa: umu-nne-ya ndi fọduru afọdu ewe laghachikute umu Israel.
4
Ọ gēguzo kwa, zùa ìgwè aturu-ya n'ike nke Jehova, na nbili-elu nke aha Jehova, bú Chineke-ya: ha gēbiri kwa; n'ihi na ub͕u a ka ọ gādi uku rue nsọtu nile nke uwa.
5
Onye a gābu kwa udo: mb͕e Asiria gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ulo-elu nile ayi, ayi gēme kwa ka ndi-ọzùzù-aturu asa na ndi-isi madu asatọ bilie imegide ya.
6
Ha gēji kwa mma-agha b͕uchapu ala Asiria na ala Nimrod n'ọnu-uzọ-ya nile: ọ gānaputa kwa ayi n'aka Asiria, mb͕e ọ gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ókè-ala-ayi.
7
Ndi Jekob fọduru gādi kwa n'etiti ọtutu ndi di iche iche dika igirigi sitere n'ebe Jehova nọ, dika aburubu-miri n'elu ihe-ọkukú; nke nādighi-ele anya onye ọ bula, nke nādighi-echere kwa umu madu.
8
Ndi Jekob fọduru gādi kwa n'etiti mba nile, n'etiti ọtutu ndi di iche iche, dika ọdum n'etiti anumanu nke oké ọhia, dika nwa-ọdum n'etiti ìgwè ewu na aturu nile: nke gābu, mb͕e ọ gāgabiga, ọ gāzọda, dọkasia, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.
9
Ka aka-gi di elu imegide ndi nākpab͕u gi, ka ebipu kwa ndi-iro-gi nile.
10
Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na M'gēbipu inyinya-gi nile n'etiti gi, me ka ub͕ọ-ala-gi nile la n'iyì:
11
M'gēbipu kwa obodo nile nke ala-gi, kwatue ebe-gi nile ewusiri ike:
12
M'gēbipu kwa n'aka-gi mb͕asi nile; i gaghi-enwe kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ:
13
M'gēbipu kwa arusi-gi nile apiri api na ogidi-gi nile n'etiti gi; i gaghi-akpọ kwa isi ala nye ọlu aka-gi ọzọ.
14
M'gēropu kwa Asherim-i n'etiti gi: M'gēkpochapu kwa ndi-iro-gi nile.
15
M'gābọ̀ kwa ọ́bọ̀ n'iwe na n'ọnuma n'aru mba nile ndi nānughi olum.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7