bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
2 Chronicles 11
2 Chronicles 11
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 12 →
1
Mgbe Rehoboam bịarutere Jerusalem, ọ kpọkọtara ndị ụlọ Juda niile na ndị ebo Benjamin, ha dị narị puku na iri asatọ nʼọnụọgụgụ, ụmụ okorobịa ndị tozuru ịga agha, ka ha gaa buso ụlọ Izrel agha ma weghachitekwa alaeze nʼokpuru ọchịchị Rehoboam.
2
Ma okwu Onyenwe anyị rutere Shemaya, onye nke Chineke ntị:
3
“Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na Izrel niile nọ na Juda na Benjamin,
4
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ndị Izrel ibe unu agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme ihe ndị a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu niile nke Onyenwe anyị. Ha tụgharịrị laghachi azụ nʼịga megide Jeroboam.
5
Rehoboam bigidere na Jerusalem wusie obodo ndị dị na Juda ike nʼihi nchedo.
6
Obodo ndị a bụ Betlehem, Etam, Tekoa,
7
Bet Zoa, Soko, Adulam,
8
Gat, Maresha, Zif,
9
na Adoraim, Lakish, Azeka
10
Zora, Aijalon na Hebrọn. Obodo ndị a bụkwa obodo ndị Juda na Benjamin e wusiri ike.
11
O wusiri ha ike tinye ndịisi agha nʼime ha, tinyekwa ihe oriri na mmanụ oliv na mmanya.
12
O tinyere ọta na ùbe nʼebe niile a na-edebe ngwa agha nʼobodo niile, nʼihi iche obodo ya nke ọma, ebe ọ bụ naanị Juda na Benjamin nọ nʼokpuru ya.
13
Ma ndị nchụaja niile na ndị Livayị ndị sitere nʼakụkụ niile nke Izrel dịnyere ya.
14
Ndị Livayị hapụchara ebe ịta nri anụ ụlọ ha na ihe niile ha nwere bịa biri na Juda na Jerusalem, nʼihi na Jeroboam na ụmụ ya ndị ikom jụrụ ha dịka ndị nchụaja Onyenwe anyị.
15
Ọ họpụtara ndị nchụaja nke aka ya, maka ebe niile dị elu, nakwa ife arụsị ewu na nwa ehi ndị ahụ ọ kpụrụ.
16
Ndị si nʼebo niile nke Izrel, ndị kpebiri nʼobi ha ịchọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel sooro ndị Livayị bịa Jerusalem ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke nna nna ha.
17
Ha mere ka alaeze Juda sie ike. Ha kwagidekwara Rehoboam nwa Solomọn afọ atọ, na-agbasokwa nʼụzọ niile nke Devid na Solomọn nʼoge a.
18
Rehoboam, lụrụ Mahalat, bụ nwa nwanyị Jerimot nwa Devid, na Abihail, nwa nwanyị Eliab, nwa Jesi.
19
Ọ mụtaara ya ụmụ ndị ikom atọ ndị a: Jeush, na Shemaraya, na Zaham.
20
Emesịa, ọ lụkwara nwunye ọzọ aha ya bụ Maaka, nwa nwanyị Absalọm. Ụmụ ha mụtara bụ Abija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.
21
Rehoboam hụrụ Maaka nwa nwanyị Absalọm nʼanya karịa ndị nwunye ya na ndị iko ya nwanyị niile. O nwere ndị nwunye iri na asatọ, nweekwa iri ndị iko nwanyị isii. Ọ mụtara iri ndị ikom abụọ na asatọ, na iri ụmụ nwanyị isii.
22
Rehoboam mere Abija nwa Maaka onyeisi nʼetiti ụmụ eze niile nʼihi na ọ chọrọ ime ya eze.
23
O ji ezi uche zipụchaa ụmụ ya ndị ikom gaa nʼala ndị Juda na Benjamin, nakwa nʼobodo ndị ahụ e wusiri ike. O nyere ha ihe e ji elekọta ndụ nʼebe ọ bara ụba ma lụọkwara ha ọtụtụ ndị inyom.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36