bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
2 Chronicles 15
2 Chronicles 15
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 16 →
1
Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị Azaraya nwa Oded.
2
Ọ pụrụ jekwuru Asa sị ya, “Geenụ m ntị, gị Asa na ndị Juda niile na Benjamin. Onyenwe anyị ga-anọnyere unu oge niile unu na-eme okwu ya. Unu ga-achọta ya mgbe ọbụla unu chọrọ ya. Ma ọ ga-agbakụta unu azụ oge ọbụla unu nupuru isi nʼiwu ya.
3
Ma ọtụtụ oge dị anya ndị Izrel nọ na-enweghị Chineke nke ezie, ha enweghịkwa onye nchụaja ga-ezi ihe, ha enweghịkwa iwu Chineke
4
Ma mgbe ọbụla ha chigharịkwutere Onyenwe anyị, Chineke Izrel tikuo ya nʼime mkpagbu ha, ọ na-enyere ha aka.
5
Nʼoge ahụ, ọ dịghị udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ ịgagharị nʼobodo, maka na ndị niile bi nʼala ahụ nọ nʼọnọdụ oke ọgbaaghara.
6
Otu obodo na-azọpịa obodo ọzọ ebe otu mba na-emegidekwa mba ọzọ nʼihi na Chineke ji nsogbu dị iche iche megide ha.
7
Ma unu ndị Juda, unu adala mba nʼọrụ ọma unu, nʼihi na a ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ unu.”
8
Mgbe Asa nụrụ okwu ndị a, bụ amụma Azaraya nwa Oded, ọ bụ onye a gbara ume. O wepụrụ ihe arụ niile dị nʼala Juda na Benjamin na nke dị nʼobodo niile ahụ o meriri nʼagha ndị dị nʼugwu Ifrem. Ọ wuziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke dị nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
9
Mgbe ahụ, Asa kpọrọ ndị Juda na Benjamin niile oku, ha na ndị ọbịa niile si Izrel, nʼihi na ọtụtụ sitere nʼala Ifrem na Manase, na Simiọn gbafeta Juda, mgbe ha hụrụ na Onyenwe anyị Chineke nọnyeere Asa.
10
Ha niile zukọrọ na Jerusalem nʼọnwa nke atọ nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị eze Asa.
11
Nʼoge ahụ, ha ji narị ehi asaa na puku atụrụ na ewu asaa, chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼụbọchị ahụ. Anụmanụ ndị a so nʼihe ha kwatara nʼagha.
12
Emesịa, nʼụbọchị ahụ, ha gbara ndụ, kpebie na ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke nna ha ka ha ga-efe.
13
Ha kpebikwara na onye ọbụla nke na-agaghị efe Onyenwe anyị, Chineke Izrel ga-anwụ, ma onye ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, nwantakịrị maọbụ okenye.
14
Ha niile ji oke olu na iti mkpu na opi na opi ike, ṅụọrọ Onyenwe anyị iyi.
15
Ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na ha ji obi ha niile ṅụọ iyi a. Ha jikwa obi ha niile chọọ Chineke. O mere ka ha chọta ya. Onyenwe anyị nyekwara ha udo nʼakụkụ niile.
16
Eze Asa chụdakwara nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya, sụpịa ya, kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn.
17
Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu site nʼIzrel, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile
18
O webatara nʼime ụlọnsọ ukwu Chineke, ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile, nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
19
Ọ dịkwaghị agha ọzọ a lụrụ tutu ruo nʼafọ iri atọ na ise nke ọchịchị eze Asa na Juda.
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 16 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36