bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Amos 3
Amos 3
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 4 →
1
Nụrụnụ okwu ndị a nke Onyenwe anyị kwuru megide unu, unu ndị Izrel, megidekwa ezinaụlọ ahụ niile nke m kpọpụtara site nʼala Ijipt.
2
“Naanị unu ka m họọrọ nʼime ezinaụlọ niile nke nọ nʼelu ụwa; Ọ bụ nʼihi nke a ka m ga-eji nye unu ahụhụ nʼihi mmehie unu niile.”
3
Mmadụ abụọ ga-esi aṅaa jekọọ ije ma ọ bụrụ na ha enweghị nkwekọrịta?
4
Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịa ma ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ? Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya, mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu?
5
Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼala ma ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya? Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchi ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara?
6
Mgbe a fụrụ opi nʼobodo, ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji? Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị?
7
Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma.
8
Ọdụm agbọọla ụja, o nwere onye na-agaghị atụ egwu? Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu, onye ga-ahapụ ibu amụma?
9
Kwusaanụ ya nʼobodo niile e wusiri ike nke Ashdọd na ebe niile e wusiri ike nke Ijipt, sị, “Zukọtanụ nʼelu ugwu niile nke Sameria ka unu hụ oke ọgbaaghara nke dị nʼetiti ya na mmegbu niile nke dị nʼetiti ndị ya. ”
10
“Ha echezọọla ime ezi ihe.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụ nʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike.”
11
Nʼihi ya nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Onye iro na-abịa! Ọ ga-agba ala gị gburugburu; ọ ga-akwatu ebe niile gị bụ nke e wusiri ike, ma kwakọrọkwa ihe niile dị nʼụlọ gị ndị ahụ e wusiri ike.”
12
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụta naanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm, otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria, na nkuku isi ihe ndina na nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina. ”
13
“Nụrụ nke a, ma gbaanụ ama megide ụmụ Jekọb,” ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri.
14
“Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha, aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel. Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa, mee ka ha daa nʼala.
15
Aga m etida ụlọ ndị niile ha wuru maka oge oyi, na nke ha wuru maka oge okpomọkụ; aga m ebibikwa ụlọ ndị ahụ niile ha ji ọdụ enyi wuo. Ọtụtụ ebe obibi ha niile ka a ga-etitukwa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9