bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Amos 4
Amos 4
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 5 →
1
Nụrụ okwu a, unu nne ehi nke Bashan, ndị na-ebi nʼelu ugwu Sameria, unu ndị inyom na-emegbu ndị ogbenye, ma zọpịakwa ndị mkpa na-akpa, ndị na-asị di ha, “welatara anyị ihe ọṅụṅụ”
2
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela ịdị nsọ ya ṅụọ iyi, sị, “Ụbọchị ahụ aghaghị ịbịa mgbe a ga-eji nko dọkpụrụ unu pụọ; jiri nko azụ dọkpụrụ ọ bụladị onye ikpeazụ nʼime unu.
3
Ọ bụ site nʼoghere dị iche iche e mere na mgbidi obodo, ka onye ọbụla ga-esi nʼahịrị nʼahịrị pụọ, a ga-atụga unu nʼụzọ Hamon.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
4
“Gaanụ na Betel, ma jehie. Jeenụ Gilgal mee ka mmehie baa ụba. Butenụ ihe aja unu ụtụtụ niile. Webatakwanụ onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri unu nʼụbọchị atọ ọbụla.
5
Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko; kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye, nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel, nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
6
“E mere m ka unu nwee eze dị ọcha nʼobodo unu niile, mekwa ka ụkọ nri dị nʼọnụmara unu niile ma unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
7
“Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara mmiri izoro unu, mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido. Enyere m otu obodo mmiri ozuzo, ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ. Mmiri zoro nʼotu ubi, ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ.
8
Ndị si obodo abụọ maọbụ atọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ jee nʼobodo ọzọ, ma ha enwetaghị nke ha ji aṅụju afọ, ma nʼime ihe ndị a niile unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
9
“Ezitere m ọrịa nchakpọ nʼubi unu niile a gbara ogige, ya na ubi vaịnị unu niile, ọtụtụ oge, werekwa ọrịa na-eripịa ihe ubi na ọmụma ebu bibie ha, zitekwa igurube nke richapụrụ osisi fiig na osisi oliv unu niile, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
10
“Ezitere m nʼetiti unu ajọ ọrịa na-efe efe dịka ndị ahụ m zitere ndị Ijipt. Ejiri m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu, mee ka a dọta ịnyịnya agha unu nʼagha. Emere m ka isisi ọjọọ ndị niile nwuru nʼọmụma ụlọ ikwu unu jupụta imi unu, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
11
“Akwaturu m ụfọdụ nʼime unu dịka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra. Unu dịka ọlọkọ nkụ ọkụ alọpụtara site nʼọkụ, ma unu alọghachikwuteghị m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
12
“Nʼihi ya, ihe ndị a ka m na-aga ime gị, gị bụ Izrel. Ebe ọ bụkwa na ejikerela m ime gị ihe ndị a, jikere, O Izrel, izute Chineke gị.”
13
Ma lee, onye na-akpụ ugwu niile, onye na-ekekwa ifufe, nke na-ekpughekwa echiche uche ya nye mmadụ, onye na-emekwa ka chi ọbụbọ ghọọ ọchịchịrị, na-azọchakwa ugwu niile nʼọbụụkwụ ya, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9