bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Genesis 23
Genesis 23
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 24 →
1
Sera dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ abụọ na asaa.
2
Ọ nwụrụ na Kiriat Arba (nke bụ Hebrọn), nʼala Kenan. Ebraham ruru ụjụ nʼihi Sera, kwaa akwa nke ukwuu nʼihi ọnwụ ya.
3
Ebraham sitere nʼebe ozu nwunye ya dị pụọ, jekwuru ụmụ Het gwa ha sị,
4
“Abụ m ọbịa na onye obodo ọzọ nʼetiti unu. Resinụ m ala m ji eme ebe olili nʼebe a, ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ.”
5
Ụmụ Het zara Ebraham sị,
6
“Nna anyị ukwu, gee anyị ntị. Nwa eze dị ukwu ka ị bụ nʼetiti anyị, lie onye gị nwụrụ anwụ nʼili ahụ nke kachasị mma nʼime ili anyị nwere. O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ajụ inye gị ala olili ya maka ili onye gị nwụrụ anwụ.”
7
Mgbe ahụ, Ebraham biliri kpọọ isiala nʼihu ndị nwe ala, bụ ndị Het,
8
sị ha, “Ọ bụrụ ọchịchọ unu ka m lie onye m nwụrụ anwụ, geenụ m ntị ma rịọrọ m Efrọn nwa Zoha,
9
ka o resi m ọgba Makipela, nke bụ nke ya, nke dị na ngwụsị ọhịa ya. Gwa ya ka o resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru ka ọ bụrụ ebe olili m nwere nʼetiti unu.”
10
Efrọn onye Het nʼonwe ya so nọdụ nʼebe ahụ nʼetiti ndị ya. Ọ zara Ebraham nʼihu ndị Het niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo
11
sị ya, “Mba! Nna m ukwu, gee m ntị. Ana m enye gị ala ahụ na ọgba dị nʼime ya nʼihu ndị a niile bụ ndị m. Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”
12
Ọzọ Ebraham kpọrọ isiala nye ndị nwe ala,
13
ọ sịrị Efrọn, nʼihu ha niile, “Biko gee m ntị, aga m akwụ gị ọnụahịa iji zụọ ala ahụ. Nara m ya ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ nʼime ya.”
14
Efrọn zara Ebraham,
15
“Gee m ntị, nna m ukwu, ọ bụ ezie na ala ahụ ruru narị shekel ọlaọcha anọ, ma gịnị ka nke a bụ nʼetiti mụ na gị? Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”
16
Ebraham kwenyere nʼego ole Efrọn chọrọ ka ọ kwụọ. O ji ihe ọtụtụ tụpụtara Efrọn ego ruru ọnụahịa ọ kpọrọ aha nʼihu ndị Het niile, narị shekel ọlaọcha anọ, dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa.
17
Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu,
18
ghọrọ nke Ebraham dịka ihe nzụta ya nʼihu ụmụ Het, nʼihu ndị niile ndị bịara nʼọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ.
19
Emesịa, Ebraham liri Sera nwunye ya nʼime ọgba ahụ dị nʼala dị na Makipela na nso Mamre (nke dị na Hebrọn) nʼala ndị Kenan.
20
Ya mere, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya ka ndị Het resiri Ebraham ka ọ bụrụ nke ya, ebe a na-eli ozu.
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 24 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50