bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Genesis 37
Genesis 37
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 36
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 38 →
1
Jekọb bigidere nʼala Kenan, ala ahụ nna ya buru ụzọ biri nʼime ya.
2
Nke a bụ usoro akụkọ banyere ezinaụlọ Jekọb. Josef, onye gbarala afọ iri na asaa, na-esonyere ụmụnne ya ndị ikom na-azụ igwe anụ ụlọ, ya onwe ya bụ naanị nwantakịrị na-enyere ụmụ Bilha na ụmụ Zilpa ndị nwunye nna ya aka. Ma Josef na-ewetara nna ha akụkọ maka ihe ọjọọ ha na-eme.
3
Ma Izrel hụrụ Josef nʼanya karịa ụmụ ya ndị ikom ndị ọzọ niile nʼihi na Josef bụ nwa a mụụrụ ya nʼoge agadi ya. Ọ kwaara ya uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa.
4
Mgbe ụmụnne ya chọpụtara na nna ha hụrụ ya nʼanya karịa onye ọbụla nʼime ha, ha kpọrọ ya asị, ha adịghị agwakwa ya okwu ọma.
5
Otu oge, Josef rọrọ nrọ, mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya nrọ a ọ rọrọ, ha kpọrọ ya asị karịa.
6
Ọ gwara ha, “Geenụ ntị na nrọ a m rọrọ.
7
Anyị niile nọ nʼubi na-achịkọta ọka, ngwangwa ukwu ọka nke m biliri guzoro ọtọ, ebe ukwu ọka nke unu niile gbara ukwu ọka nke m gburugburu, na-akpọ isiala nye ya.”
8
Ụmụnne ya jụrụ ya, “Ị na-akọwa na ọ bụ gị ga-abụ eze anyị? Na ọ bụ gị nʼezie ga-achị anyị?” Ha kpọrọ ya asị karịa nʼihi nrọ ya na okwu ya niile.
9
Josef rọkwara nrọ ọzọ, kọkwara ụmụnne ya. Ọ sịrị, “Geenụ ntị, arọrọ m nrọ ọzọ. Ma na nrọ nke ugbu a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu na-akpọ isiala nye m.”
10
Ma mgbe ọ kọọrọ nna ya na ụmụnne ya nrọ a. Nna ya baara ya mba, sị, “Nrọ nke a ị rọrọ bụ nrọ gịnị? Ọ bụ ezie na anyị niile, mụ onwe m na nne gị na ụmụnne gị, ga-abịa na-akpọrọ gị isiala?”
11
Ụmụnne ya kwosiri ya ekworo nʼihi ya, ma nna ya debere ihe ndị a niile nʼobi ya.
12
Ka ọ dị, ụmụnne ya gara ilekọta igwe anụ ụlọ nna ha na Shekem.
13
Izrel sịrị Josef, “Dịka ị maara, ụmụnne gị nọ na-eche anụ ụlọ na Shekem. Bịa, aga m eziga gị nʼebe ahụ.” Josef zara sị, “Ọ dị mma.”
14
Ya mere, ọ gwara ya, “Gaa ka ị chọpụta ma ihe ọ na-agazikwara ụmụnne gị na igwe anụ ụlọ ndị ahụ nke ọma, ma weghachiri m ozi.” O sitere na Ndagwurugwu Hebrọn zipụ ya. Ọ bịaruru Shekem,
15
ma otu nwoke hụrụ ya ka ọ na-awagharị gburugburu nʼọhịa dị nʼebe ahụ, ọ jụrụ ya, “Gịnị ka ị na-achọ?”
16
Ọ sịrị, “Ana m achọ ụmụnne m. Biko, ị nwere ike ịgwa m ebe ha nọ na-azụ igwe anụ ụlọ ha?”
17
Nwoke ahụ zara sị, “Ha esitela nʼebe a pụọ. Anụrụ m ka ha na-asị, ‘Ka anyị gaa Dọtan.’ ” Ya mere, Josef gawara Dọtan ịchọ ụmụnne ya. Ọ hụkwara ha nʼebe dị nso na Dọtan.
18
Ma ha lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.
19
Ha sịrịtara onwe ha, “Lee eze nrọ ahụ ka ọ na-abịa!
20
Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a. Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.”
21
Ruben nụrụ ihe a, ma napụtakwa ya site nʼaka ha. Ọ sịrị, “Ka anyị hapụ igbu ya.”
22
Ruben sịrị ha, “Ka unu hapụ ịkwafu ọbara. Kama tụnyenụ ya nʼime olulu a dị nʼọzara. Ma unu akpatụkwala ya aka.” Ma nzube ya bụ ịnapụta ya site nʼaka ha, dulaara ya nna ya.
23
Ya mere, mgbe Josef bịakwutere ụmụnne ya, ha yipụrụ ya uwe mwụda ya, uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa o yi nʼahụ.
24
Ha duru ya tụnye ya nʼime olulu. Ọ bụ olulu tọgbọrọ nʼefu, nke mmiri na-adịghị nʼime ya.
25
Mgbe ha nọdụrụ ala bido iri nri, ha leliri anya ha hụ igwe ndị ahịa Ishmel si Gilead. Ịnyịnya kamel ha bu ụda na mgbaa na máá. Ọ bụkwa Ijipt ka ha bu ihe ndị a na-aga.
26
Mgbe ahụ, Juda jụrụ ụmụnne ya, “Uru gịnị ka ọ ga-abara anyị igbu nwanne anyị, ma kpuchie ọbara ya?
27
Bịanụ, ka anyị resi ya ndị Ishmel ndị a, ka aka anyị ghara nʼimetụ ya, nʼihi na nwanne anyị na otu anụ ahụ anyị ka ọ bụ.” Ụmụnne ya gere ya ntị.
28
Mgbe ndị ahịa Midia ahụ rutere, ha sitere nʼolulu dọpụta Josef resi ya ndị Ishmel ahụ, ndị kwụrụ ụmụnne Josef iri mkpụrụ shekel ọlaọcha abụọ. Ha duuru Josef gaa Ijipt.
29
Ruben mechara lọghachi gaa nʼolulu ahụ, ma ka ọ na-ahụghị Josef nʼime olulu a, ọ dọwara uwe ya.
30
O jekwuru ụmụnne ya sị ha, “Nwata ahụ anọkwaghị ebe ahụ! Mụ onwe m, olee ebe m ga-ala?”
31
Ụmụnne ya gburu otu ewu were uwe Josef bịanye nʼime ọbara ya.
32
Ha chịịrị uwe mwụda ahụ nwere ọtụtụ agwa jekwuru nna ha sị ya, “Anyị hụrụ uwe a nʼime ọhịa. Leruo ya anya ka ị mara maọbụ uwe mwụda nwa gị.”
33
Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.”
34
Mgbe ahụ, Jekọb dọwara uwe ya, yiri akwa mkpe, ruo ụjụ ọtụtụ ụbọchị nʼihi nwa ya.
35
Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile bịara ịkasị ya obi, ma ọ jụrụ ịnabata nkasiobi ọbụla. Ọ sịrị, “Aga m alakwuru nwa m nʼala mmụọ site nʼiru ụjụ.” Nna ya kwagidere akwa nʼihi ya.
36
Ugbu a, ndị Midia ahụ rere Josef nʼIjipt, resi ya Pọtifa, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, onye bụ onyeisi ndị nche Fero, bụ eze Ijipt.
← Chapter 36
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 38 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50