bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Zechariah 10
Zechariah 10
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 11 →
1
Rịọọnụ Onyenwe anyị mmiri ozuzo nʼoge mmiri ozuzo nke ikpeazụ, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-ezite oke amụma mmiri. Ọ bụ ya na-enye ụmụ mmadụ mmiri ozuzo, na-enyekwa mmadụ niile ihe ọkụkụ nke ubi.
2
Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ, ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha, ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha, okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye. Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụ a na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ.
3
“Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ, aga m atakwa ndị ndu niile ahụhụ; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda, ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha.
4
A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ, a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu, a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha, sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche.
5
Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha, ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile. Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha, ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya.
6
“Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike, zọpụtakwa ụlọ Josef. Aga m eme ka ha lọghachita, nʼihi na aga m egosi ha obi ebere. Ha ga-adị ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha, aga m azakwa arịrịọ ha.
7
Ndị Ifrem ga-aghọ ndị dị ike nʼagha, ha ga-enwe ọṅụ dịka ndị na-aṅụ mmanya. Ụmụ ha ga-ahụ ya ṅụrịakwa ọṅụ, ha ga-ejikwa obi ha niile ṅụrịa ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
8
Mgbe ahụ, aga m akpọ ha oku, chịkọtaa ha. Nʼezie, aga m agbapụta ha, ha ga-adịkwa ukwuu dịka ha dị na mbụ.
9
A sịkwarị na m chụsara ha nʼetiti ndị dị iche iche, ma ha ga-echeta m site nʼala niile ahụ dị anya. Ha na ụmụ ha ga-adịkwa ndụ; ha ga-alọtakwa.
10
Aga m esi nʼala Ijipt kpọlata ha, sitekwa nʼAsịrịa chịkọtaa ha. Aga m akpọta ha na Gilead na Lebanọn. Ha agaghị enwekwa ebe ga-ezuru ha niile.
11
Ha ga-esi nʼosimiri nsogbu gafee. A ga-emekwa ka mmali elu nke osimiri dajụọ. Ebe obibi niile nke osimiri Naịl ga-atakọrọkwa. A ga-egbuda mpako niile nke Asịrịa, wezugakwa mkpara ọchịchị nke ndị Ijipt.
12
Aga m eme ka ha dị ike nʼime Onyenwe anyị, ọ bụkwa nʼaha ya ka ha ga na-ejegharị nʼudo.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 11 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14