bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Zechariah 13
Zechariah 13
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 14 →
1
“Nʼụbọchị ahụ, a ga-emeghe isi iyi mmiri nye ụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem. Ọ ga-abụ isi iyi a ga-eji sachapụ mmehie na adịghị ọcha ha niile.
2
“Nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri, aga m ebipụ aha arụsị niile dị nʼala ahụ, a gaghị echetakwa ha ọzọ. Aga m esitekwa nʼala a wezuga ma ndị amụma ma mmụọ nke adịghị ọcha niile.
3
Ọ bụrụkwa na onye ọbụla a ga nʼihu na-ebu amụma, nne na nna ndị mụrụ ya ga-asị ya, ‘Ị ghaghị ịnwụ nʼihi na i kwuola okwu ụgha nʼaha Onyenwe anyị.’ Mgbe onye dị otu a bukwara amụma, ọ bụ nne na nna ya ga-eji ùbe magbuo ya.
4
“Nʼụbọchị ahụ, ihere ga-emekwa ndị amụma nʼihi ibu amụma banyere ọhụ nke ha hụrụ. Ha agaghị eyikwa uwe ajị anụ nke ndị amụma na-eyi nʼihi iduhie ndị mmadụ,
5
Onye ọbụla nʼime ha ga-asịkwa, ‘Abụghị m onye amụma, onye ọrụ ubi ka m bụ, ọ bụ ihe si nʼala ka m ji azụ onwe m site na mgbe m bụ okorobịa.’
6
Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ, ‘Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?’ Ha ga-azaghachi, ‘Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.’
7
“Teta nʼụra, gị mma agha, imegide onye ọzụzụ atụrụ m, na imegide nwoke ibe m, nke nọ m nso,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ ga-agbasasịkwa. Aga m eweli aka m megide ndị dị nta.
8
Nʼala ahụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Ụzọ mmadụ abụọ nʼime ụzọ atọ ka a ga-etida, ma otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-afọdụ nʼime ya.
9
Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ. Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha, jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo. Ha ga-akpọku aha m, aga m azakwa ha. Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’ Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘ Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.’ ”
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14