bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Thessalonians 1
2 Thessalonians 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 2 →
1
Ọ bụ Pọl, na Saịlas, na Timoti na-edegara nzukọ Kraịst dị nꞌobodo Tesalonaịka akwụkwọ a, bụ ndị a na-echebe nꞌime Chineke Nna anyị, na nꞌime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
2
Ka Chineke bụ Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst gọzie unu, ma tụkwasịkwara unu udo nke ya.
3
Inye Chineke ekele nꞌihi unu abụghị nanị ihe dị mma ka anyị mee, kama ọ bụ ụgwọ ọrụ anyị ji Chineke, ụmụnna anyị, karịsịa, mgbe anyị chetara na dị ka unu si na-eto eto nꞌime okwukwe unu na otu a ka oke ịhụnanya unu nwere nꞌebe ibe unu dị si bụrụ ihe a na-enweghị ihe a ga-eji tụnyere ya.
4
Nꞌihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nꞌetiti nzukọ Kraịst nile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachi obi nọgidesie ike nꞌime nsogbu nile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu nꞌime Chineke, ọ bụladị nꞌetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu.
5
Nke a bụ nanị otu ụzọ Chineke si gosi na ihe nile ọ na-eme bụ ihe ziri ezi. Nꞌihi na Chineke na-eji nsogbu ndị a dakwasịrị unu na-akwado unu maka alaeze ya.
6
Ma ya onwe ya, site na mkpagbu ndị a, na-akwadoro ndị ahụ na-akpagbu unu ikpe ọmụma na ahụhụ.
7
Ya mere, anyị na-agwa unu, ndị so anyị na-ahụ ahụhụ, na Chineke ga-anapụta unu, nye unu izuike, mgbe Onyenwe anyị Jisọs ga-apụta ìhè na mbara eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi ya.
8
Ọ ga-ata ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ ebighị ebi nꞌọkụ ala mmụọ. Ee, ọ ga-ata ndị ahụ ahụhụ, bụ ndị jụrụ ịnabata ụzọ nzọpụta ya nke o mere ka ọ pụta ìhè nꞌime Jisọs Kraịst.
9
A ga-etinye ndị a nꞌime ọkụ ala mmụọ, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya ruo mgbe ebighị ebi,
10
mgbe ọ ga-abịa ịnara ịja mma na otuto dị nsọ, nꞌihi ihe nile o meere ndị nsọ ya. Unu na ya ga-anọ nꞌoge a, nꞌihi na unu kweere okwu Chineke ahụ anyị gwara unu.
11
Ebe ihe ga-esi otu a dịrị, anyị na-arịọ Chineke arịrịọ nꞌihi unu, ka o mee unu ụdị ụmụ ya ọ chọrọ ka unu bụrụ. Ka o mee ka unu dị mma dị ka ọ chọrọ, ka o site nꞌokwukwe unu nye unu ike ya.
12
Mgbe ahụ, mmadụ nile ga-eto aha Onyenwe anyị mgbe ha ga-ahụ ọrụ ọ rụpụtara nꞌime unu. Nsọpụrụ dị oke elu nke unu ga-enwe ga-abụ na unu bụ ndị Chineke. Ọ bụ obi ebere Chineke anyị na obi ebere Onyenwe anyị Jisọs mere ka ihe dị otu a rute unu aka.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3