bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Thessalonians 3
2 Thessalonians 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
1
Na mmechi okwu anyị, ụmụnna anyị, kpeerenụ anyị ekpere. Rịọnụ arịrịọ ka Chineke mee ka ozi ọma Onyenwe anyị na-aga nꞌihu. Ka ike dị nꞌozi ọma ahụ weta nchegharị nꞌime ndị nile ga-anụ ya dị ka o wetara nꞌime ndụ unu, mgbe anyị bịakwutere unu na mbụ.
2
Ọzọ kwa, kpesiekwaranụ anyị ekpere ike, ka anyị ghara ịdaba nꞌaka ndị mmadụ ọjọọ nꞌihi na ọ bụghị mmadụ nile hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya.
3
Ma Chineke bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-eme ka unu dịrị ike. Ọ ga-echebekwa unu ka unu hapụ ịdaba nꞌaka ekwensu.
4
Anyị nwere olileanya na ntụkwasị obi nꞌime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na unu na-eme ihe ahụ nile anyị ziri unu, na unu ga-agakwa nꞌihu na-eme ha.
5
Ka Onyenwe anyị duzie unu ịghọta ịhụnanya Chineke nwere nꞌebe unu nọ. Ee, ka o duziekwa unu ịghọta ụdị ntachi obi ahụ na-esite nꞌebe Kraịst nọ abịa.
6
Ụmụnna anyị, nke a bụ iwu anyị na-enye unu site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka unu na onye ọ bụla kpọrọ onwe ya onye Kraịst na-ebi ndụ umengwụ na nke arụsịghị ọrụ ike dị ka anyị ziri unu hapụ inwekọ ihe ọ bụla.
7
Nꞌihi na unu maara nke ọma nꞌime onwe unu na unu kwesịrị ịgbaso omume anyị. O nweghị mgbe ọ bụla unu hụrụ anyị ka anyị na-agagharị hapụ ọrụ anyị kwesịrị ịrụ.
8
O nweghị onye ọ bụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọ bụla.
9
Anyị mere ihe ndị a, ọ bụghị nꞌihi na anyị enweghị ike ịkwagide unu ka unu na-enye anyị nri dị ka o kwesịrị ịdị. Kama nzube anyị bụ ka anyị bụrụ ihe ilere anya nye unu, na ndị unu ga-eji maa ezi atụ banyere mkpa ọ dị ịrụsị ọrụ ịke.
10
Mgbe anyị na unu nọkwa anyị nyere unu iwu sị, “Onye na-arụghị ọrụ agaghị eri nri.”
11
Ma emeela ka o ruo anyị ntị na ọtụtụ mmadụ nꞌetiti unu nọ nꞌefu, na-arụghị ọrụ ọ bụla. Kama ha ga-arụ ọrụ dịrị ha, ha na-ejegharị na-etinye anya nꞌihe na-agbasaghị ha.
12
Anyị na-enye ndị dị otu a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, sị ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta.
13
Otu ọ dị ụmụnna anyị, unu ekwela ka ike ịrụ ọrụ ọma gwụ unu.
14
Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ ime ihe anyị kwuru nꞌime akwụkwọ a, hụọnụ onye ahụ ama, kwụsịkwanụ iso ya nwekọọ ihe ọ bụla. Ka e si otu a mee ka ihere mee ya.
15
Unu agụkwala ya dị ka onye iro unu. Kama dụọnụ ya ọdụ dị ka unu ga-esi dụọ nwanna ọ bụla e kwesịrị ịdụ ọdụ.
16
Ugbu a, ka Onyenwe anyị, onye udo na-esi nꞌaka ya abịa tụkwasịrị unu udo ya mgbe nile, nꞌime ọnọdụ ọ bụla unu nọ nꞌime ya. Ka ọ nọnyekwara unu.
17
Mụ onwe m bụ Pọl ji aka m depụta ekele a, nke m na-ekele unu nile. Nke a bụ ihe m na-eme nꞌakwụkwọ nile m dere, igosi na ọ bụ m dere ya nꞌezie.
18
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
All chapters:
1
2
3