bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Thessalonians 2
2 Thessalonians 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 3 →
1
Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta.
2
Anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna anyị ka unu ghara ikwenye akụkọ a na-akọ ugbu a, nke na-asị na oge ọbịbịa Onyenwe anyị eruola. Ọ bụrụ na unu ahụ ndị na-ahụ ọhụ pụrụ iche banyere nke a, ma ọ bụ ndị na-ekwu na ha sitere nꞌaka Chineke nata ozi pụrụ iche banyere ya, ma ọ bụ ndị ga-agwa unu na ha nwetara akwụkwọ m dere banyere okwu a, unu ekwenyela nꞌihe ndị a nile.
3
Unu ekwela ka e duhie unu, nꞌihi na ụbọchị ọbịbịa Kraịst agaghị eru tutuu ihe abụọ emezuo. Nke mbụ, a ghaghị iburu ụzọ nwee oge oke imegide Chineke ga-adị, mgbe ajọ omume ga-aba ụba dịrịkwa nꞌụdị dị iche iche. Nke abụọ, a ghaghị iburukwa ụzọ mee ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè
4
Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu imegide ndị nile na-asọpụrụ chi dị iche iche, na ofufe nile dị iche iche, na ndị na-ekpere Chineke nꞌeziokwu. Ọ ga-abanye nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke nodụ nꞌebe ahụ kpọọ onwe ya Chineke.
5
Unu echetaghị ihe m gwara unu nꞌoge mụ na unu nọ banyere ya?
6
Ma ugbu a, unu maara na o nwere onye na-egbochi ya ka ọ hapụ ịpụta ìhè. Nꞌihi na mgbe ọ ga-apụta bụ mgbe oge ya ruru.
7
Ma ọrụ nke onye mmebi iwu ahụ ga-arụ mgbe ọ bịara ebidolarị ugbu a, ma nwoke ahụ nꞌonwe ya agaghị apụta ìhè tutuu ruo mgbe onye ahụ na-egbochi ya nyere ya ohere.
8
Mgbe ahụ, a ga-eme ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè, bụ onye ahụ Jisọs ga-eji ume ọ ga-esi nꞌọnụ ya kupụta laa nꞌiyi, ma mee ka ọ ghara ịdịkwa ọzọ.
9
Ekwensu ga-eji onye mmebi iwu ahụ na-abịa mere ngwa ọrụ. Ọ ga-ejupụta nꞌike ekwensu. Ọ ga-ejikwa aghụghọ rụọ ọrụ ebube pụrụ iduhie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-esitekwa nꞌaghụghọ dị iche iche mee ihe ịrịba ama dị iche iche.
10
Nꞌezie, ọ ga-eduhie ndị ahụ nile na-aga nꞌọkụ ala mmụọ, ndị ahụ jụrụ ikwenye eziokwu ahụ. Nꞌihi na ha jụrụ ịnabatara onwe ha eziokwu ahụ, jụ ikwere na ya, na ịhụ ya nꞌanya ka ọ zọpụta ha.
11
Nꞌihi ọjụjụ nke ha jụrụ eziokwu ahụ, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha nile nabata okwu ụgha ndị a.
12
Site na nke a, ọmụma ikpe Chineke ga-adịrị ha nꞌihi na nọ na-enwe aṅụrị nꞌọrụ nile nke ajọ omume kama ikwere eziokwu ahụ.
13
Ma ụmụnna anyị, ndị Chineke anyị hụrụ nꞌanya, ọ bụ ọrụ anyị ikele Chineke ekele mgbe nile nꞌihi na o buru ụzọ họpụta anyị maka ịzọpụta anyị na ịsacha anyị site nꞌọrụ Mmụọ Nsọ rụrụ, na site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌeziokwu ahụ.
14
Ọ bụ site nꞌọrụ ịgbasa ozi ọma anyị ka Chineke ji kpọbata unu. Ọ bụkwa site nꞌozi ọma ahụ anyị ziri unu ka o ji kpọbata unu iketa oke nꞌebube Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
15
Ya mere, ụmụnna anyị, ebe unu maara ihe ndị a nile, guzosienụ ike, jidesiekwanụ ozizi ahụ anyị ziri unu ike. Nọgidenụ nꞌozizi ahụ anyị mere ka unu mụta site nꞌozizi anyị ziri unu, ya na akwụkwọ anyị deere unu.
16
Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nꞌonwe ya, na Chineke Nna, onye sitere nꞌobi ebere ya hụ anyị nꞌanya, nye anyị nkasịobi na olileanya ebighị ebi nke anyị na-ekwesịghị iketa.
17
Ya nye unu nkasịobi na ụdị ike ahụ ga-enyere unu aka ịrụ ọrụ ọma, na ikwu okwu ọma.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3