bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Timothy 1
2 Timothy 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 2 →
1
Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs, onye Chineke zipụrụ ịgwa ndị nile nọ nꞌebe nile, nwoke na nwanyị, ihe banyere ndụ ebighị ebi o kwere ha na nkwa site nꞌokwukwe nꞌime Jisọs Kraịst.
2
Ọ bụ gị nwoke m hụrụ nꞌanya Timoti, ezi nwa m, ka m na-edere akwụkwọ a. Ka Chineke Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, wụkwasị gị obi ebere na amara ya na udo ya.
3
Ana m ekele Chineke ekele nꞌihi gị Timoti. Ana m ekpere gị ekpere kwa ụbọchị. Ọtụtụ mgbe kwa, ma ọ bụ nꞌime abalị, ka m na-ebili na-arịọ Chineke arịrịọ ka ọ gọzie gị. Chineke, onye bụ Chineke nke nna nna m ha, na Chineke nke m kwa. Ọ bụkwa nanị otu ihe ka m na-ezube nꞌime ndụ a, ọ bụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ.
4
Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ gị anya ọzọ. Ịhụ gị ga-abụkwa ihe oke ọṅụ nye m, nꞌihi na echetara m anya mmiri gị mgbe anyị gbasara nꞌoge ikpeazụ anyị zukọrọ.
5
Amatara m ụdị ntụkwasị obi i nwere nꞌime Onyenwe anyị, ụdị ntụkwasị obi ahụ buru ụzọ dịrị nꞌime nne gị Yunaịsi, na nꞌime nne nne gị Lọịsi. Enwekwara m olileanya na ị na-atụkwasịkwa Onyenwe anyị obi ugbu a karia.
6
Nꞌihi nke a, achọrọ m ichetara gị ka i mee ka ike nkwuwa okwu ahụ i nwere na-enwụ dị ka ọkụ. Ike ahụ Chineke nyere gị mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ nꞌisi, gọziekwa gị.
7
Nꞌihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị Mmụọ na-emejupụta anyị nꞌike, na ịhụnanya, na uche zuru oke.
8
Ọ bụrụ na ị na-akwali ike nke ime mmụọ ahụ i nwere, ụjọ agaghị atụ gị ịgwa ndị ọzọ okwu banyere Onyenwe anyị, ma ọ bụ ime ka ha mata na m bụ enyi gị. Ọ bụ ezie na m nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi aha Kraịst. Ị ga-ejikerekwa isoro m hụọ ahụhụ nꞌihi Kraịst, nꞌihi na ọ ga-agba gị ume nꞌime ahụhụ.
9
Ọ bụ Chineke zọpụtara anyị, kpọbata anyị nꞌọrụ ya dị nsọ. Ọ bụghị nꞌihi na anyị kwesịrị ka a kpọọ anyị, kama ọ bụ rịị nzube ya ịkpọ anyị tupuu a tọọ ntọ ala ụwa a, nꞌihi na ọ chọrọ isite nꞌihe ọ ga-emere anyị gosi anyị ịhụnanya ya na obi ọma ya, na amara ya site na Jisọs Kraịst.
10
Ugbu a o meela ka ihe nile o zubere ime nꞌobi ya pụta ìhè site nꞌọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike nke ọnwụ nꞌiyi zi anyị ụzọ anyị gaesi nwee ndụ ebighị ebi site nꞌịtụkwasị ya obi.
11
Chineke ahọpụtala m ka m bụrụ onye na-ekwusa ozi ọma a, na onyeozi, na onye nkuzi.
12
Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka m ji naahụ ahụhụ ndị a nꞌime ụlọ mkpọrọ nꞌebe a, ma nꞌeziokwu, ihere adịghị eme m, nꞌihi na amaara m onye m naatụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe nile m nyere ya nꞌaka idebe tutuu ruo ụbọchị ahụ ọ ga-alọghachi.
13
Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ nke mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ nke gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nꞌime Kraịst Jisọs.
14
Chezie onyinye ọma ahụ Chineke sitere nꞌaka Mmụọ Nsọ nke bi nꞌime gị nye gị idebe.
15
Dị ka ị maara, ndị Kraịst nile si nꞌEsia bịa nꞌebe a agbaketala m azụ. Ọ bụladị Faigelọs na Hamoganis ahapụla m laa.
16
Ka Onyenwe anyị gọzie ezinụlọ Onisiferọs. Nꞌihi na ọ bịara leta m, gbaa m ume ọtụtụ mgbe. Ọbịbịa ya kpọtere mmụọ m. Ihere emekwaghị ya ịbịakwute m nꞌụlọ mkpọrọ.
17
Nꞌezie, mgbe ọ bịaruru Rom, ọ chọgharịrị m nꞌebe nile, ma nꞌikpeazụ, ọ chọtara m.
18
Ekpere m bụ ka Onyenwe anyị nye ya ezi ngọzi pụrụ iche nꞌụbọchị ahụ Kraịst ga-alọghachi. Ị makwaara nke ọma karịa ka m nwere ike ịgwa gị, otu o si nyere m aka nꞌEfesọs.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4