bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Timothy 4
2 Timothy 4
Igbo 1988
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
1
Ya mere, ana m adụsi gị ọdụ ike nꞌihu Chineke na nꞌihu Kraịst Jisọs, onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe otu ụbọchị, mgbe ọ ga-abịa idozi alaeze ya, na-asị gị,
2
kwusaa okwu Chineke mgbe nile, mgbe ọ bụlạ i nwere ohere, mgbe a naanabata ya na mgbe a na-adịghị anabata ya, mgbe o kwesịrị ekwesị; na mgbe ọ na-ekwesịghị ekwesị, na-egosi ndị mmadụ ajọ omume ha, na-abara ha mba mgbe o kwesịrị ka a baara ha mba. Na-agba ha ume ka ha mee ezi ihe, ma jiri ntachi obi na-enyeju ha okwu Chineke afọ.
3
Nꞌihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị gburugburu ịchọ ndị ozizi ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ.
4
Ha agaghị ege ntị nꞌihe akwụkwọ nsọ na-ekwu, kama ha gaege ntị nꞌakụkọ na-enweghị isi.
5
Ma guzosie ike nọọ na nche mgbe nile. Atụla ụjọ ịhụ ahụhụ nꞌihi Onyenwe anyị. Rụzie ọrụ gị dị ka onye na-akpọtara Kraịst ndị mmadụ. Ahapụkwala ime ihe ọ bụla i kwesịrị ime.
6
Ana m ekwu okwu ndị a nꞌihi na site na mgbe na-adịghị anya ugbu a agaghị m anọkwa gị nso inyere gị aka. Oge ụla m eruola. Na mgbe na-adịghị anya site nꞌugbu a, aga m anọ nꞌụzọ ịla nꞌeluigwe.
7
Alụọla m ọgụ ukwu na nke nta nꞌihi Onyenwe m. Nꞌime ha nile kwa, edebeziela m onwe m nye ya dị ka onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ugbu a oge ahụ ezuola mgbe m gaakwụsị ịlụ ọgụ ma zuru ike.
8
Nꞌeluigwe, okpueze nke ezi omume dị na-eche m, nke Onyenwe anyị, onye naekpe ikpe ziri ezi ga-enye m nꞌụbọchị ahụ, ọ ga-alọghachi. Kama ọ bụghị nanị mụ onwe m ka ọ ga-enye okpueze ahụ, ọ ga-enyekwa ya ndị nile ga-eji ịhụnanya na-eche ọbịbịa ya.
9
Mee ọsịịsọ bịakwute m,
10
nꞌihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nꞌanya ahapụla m gaa Tesalonaika. Kresens agaala Galetia, Taitọs kwa agaala Dalmetia.
11
Ọ bụ nanị Luuku nọnyeere m. Mgbe ị na-abịa, kpọta Mak nꞌihi na achọrọ m ya ka ọ nọọ m nso.
12
Ezipụla m Tikikọs ka ọ gaa Efesọs.
13
Mgbe ị na-abịa, wetara m uwe m ji achụ oyi, bụ nke m hapụrụ na Troas nꞌaka Kapọs, wetakwara m akwụkwọ nile ahụ dị nꞌebe ahụ, nke ka nke akwụkwọ akpụkpọ anụ ahụ.
14
Alegzanda onye na-akpụ ọla emeela m ọtụtụ ihe ọjọọ. Onyenwe anyị ga-ata ya ahụhụ.
15
Kpachara anya nꞌebe ọ nọ, nꞌihi na o kwuru okwu megide ihe nile anyị kwuru.
16
Na mbụ mgbe a kpọtara m nꞌihu onye ikpe, ọ dịghị onye ọ bụla bịara nyere m aka, mmadụ nile gbara ọsọ hapụ m. Ekpere m bụ ka Chineke hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie.
17
Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ohere iguzosi ike na-atụghị egwu ikwusa ozi ọma ka ụwa nile nụrụ. Ọ zọpụtara m, mee ka a hapụ ịtụnye m nꞌolulu ọdụm.
18
Nꞌezie, Onyenwe anyị ga-agakwa nꞌihu ịnapụta m site nꞌihe ọjọọ nile. Ọ gaakpọbatakwa m nꞌime alaeze ya nke eluigwe. Ka otuto dịrị Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.
19
Biko, keleere m Prisila na Akwila na ndị nile bi nꞌụlọ Onisiforọs.
20
Erastọs nọ na Kọrint, ma ahapụrụ m Trofimọs na Militọs nꞌọnọdụ ahụ esighị ike.
21
Biko, jisie ike bịarute nꞌebe a tupuu oge oyi eruo. Yubutọs na-ekele gị, ya na Pudins, na Lainus na Kodia na ụmụnna anyị nile.
22
Ka onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọnyere mmụọ gị. Ka amara Chineke dinyere gị. Nọọ nke ọma.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
All chapters:
1
2
3
4
Recommended Reading
Commentary
2 Timothy Commentaries
→
Devotional
2 Timothy Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→