bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Timothy 2
2 Timothy 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 3 →
1
Timoti, nwa m, bụrụ onye dị ike site nꞌike na amara ahụ Kraịst Jisọs na-enye gị.
2
Nꞌihi na ị ghaghị izi ndị ọzọ ihe ahụ nile gị na ndị ọzọ nụrụ site nꞌọnụ m. Zi ndị kwesịrị ntụkwasị obi eziokwu ahụ, ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a.
3
Soro m hụọ ahụhụ dị ka ezi onye agha Jisọs Kraịst.
4
Ma dị ka onye agha Kraịst, ekekọtala onwe gị nꞌihe nke ụwa a. Nꞌihi na ọ dịghị onye agha ọ bụla na-ekekọta onwe ya nꞌihe nke ụwa a pụrụ ime ihe ga-atọ onye họpụtara ya dị ka onye agha ụtọ.
5
Na-eso ụkpụrụ Onyenwe anyị nꞌọrụ ị na-arụrụ ya, dị ka onye na-agba ọsọ si eso iwu nile e mere maka ịgba ọsọ, si otu a nata onyinye. Ma onye na-esoghị iwu ndị a anaghị anata onyinye ọ bụla.
6
Na-arụsikwa ọrụ gị ike dị ka onye ọrụ ubi nke na-enweta ego hiri nne, ma ọ bụrụ na ọ kụọ mkpụrụ hiri nne.
7
Na-atụgharị uche nꞌihe ịma atụ atọ ndị a, ka Onyenwe anyị nye gị nghọta nke ga-enyere gị aka iji ihe ịma atụ ndị a rụọ ọrụ na ndụ gị.
8
Echefula na Jisọs Kraịst bụ mmadụ. Na a mụrụ ya nꞌezinụlọ eze Devidi. Na ọ bụkwa Chineke nꞌihi na o sitere nꞌọnwụ bilie ọzọ.
9
Ọ bụ nꞌihi na m na-ekwu eziokwu ndị a ka m ji nọọ na-ahụ ahụhụ dị otu a, nꞌụlọ mkpọrọ. Ma ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ike m agbụ, ma ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ike okwu Chineke agbụ.
10
Ma ejikeere m ịnọ na-ahụ ahụhụ ma ọ bụrụ na nke a pụrụ ime ka ndị nile Chineke họpụtara bụrụ ndị a ga-azọpụta, na ndị gaenwe ebube ebighị ebi ahụ dị nꞌime Kraịst Jisọs.
11
Ihe na-enye m nkasịobi bụ eziokwu a, na ọ bụrụ na anyị ahụọ ahụhụ nwụọ nꞌihi Kraịst, nke a na-egosi na anyị amalitelarị isoro Kraịst na-adị ndụ nꞌeluigwe.
12
Ọ bụrụkwa na anyị echee na ọrụ anyị na-arụrụ ya ugbu a siri ike, ka anyị cheta na otu ụbọchị anyị na ya ga-anọkọ. Anyị ga-esorokwa ya bụrụ ndị na-achị achị. Ma ọ bụrụ na anyị agọnarị Kraịst mgbe anyị nọ nꞌahụhụ, ya onwe ya ga-agọnarịkwa anyị nꞌalaeze ya.
13
Ma ọ bụrụ na anyị adaa mba, nọọ nꞌọnọdụ nke enweghị okwukwe ọ bụla, ya onwe ya na-anọgide bụrụ onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi, na onye ga-enyere anyị aka. Ọ gaghị agọnarị anyị, nꞌihi na anyị bụ akụkụ anụ ahụ ya, ọ ga-emezukwa nkwa ya nile o kwere anyị.
14
Na-echetara ndị mmadụ eziokwu ndị a, na-agwasikwa ha ike nꞌaha Onyenwe anyị ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nꞌihi na okwu nzuzu ndị a na-eweta mgbagwoju anya. Ha bụkwa okwu na-abaghị uru nke naeweta nsogbu.
15
Na-arụsị ọrụ gị ike ka ị bụrụ onye Chineke ga-agwa okwu sị, “Ị meela nke ọma.” Bụrụ onye naarụ ọrụ ọma, onye ihere na-apụghị ime mgbe Chineke ga-enyocha ọrụ gị. Mara ihe okwu Chineke na-ekwu, matakwa otu e si akọwa ya.
16
Wezuga onwe gị nꞌokwu nzuzu na nke rụrụ arụ nile, ụdị okwu nke na-eduba mmadụ nꞌime mmehie, ma na-eweta iwe nꞌetiti mmadụ na ibe ya.
17
Nꞌihi na okwu ndị a bụ okwu na-eweta obi ọjọọ. Ha dị ka nsi nke na-egbu mmadụ. Haimenaus na Filetus, ndị hụrụ ịrụ ụka nꞌanya, bụ ndị na-ekwu ụdị okwu ndị a.
18
Ha ahapụla ịgbaso ụzọ eziokwu ahụ bido na-ekwusa okwu ụgha, naasị na oge mbilite nꞌọnwụ mmadụ nile agafeela. Site nꞌokwu a, ha naemekwa ka ụfọdụ ndị na-ekwere okwu ha bụrụ ndị na-ada mba nꞌokwukwe ha.
19
Ma okwu Chineke na-eguzosi ike dị ka oke nkume. Ọ dịkwaghị ihe ọ bụla pụrụ ifopụta ya. Okwu Chineke bụkwa ntọ ala nkume, nke e dere okwu ndị a nꞌelu ya, “Onyenwe anyị maara ndị bụ ndị nke ya.” E dekwara nꞌelu ya sị, “Ka onye ọ bụla kpọrọ onwe ya onye nke Kraịst kwụsị ime ihe ndị ahụ dị njọ.”
20
Nꞌime ụlọ onye ọgaranya, ọtụtụ efere dị iche iche dị ya. Ụfọdụ nꞌime efere a ka e ji ọlaedo kpụọ, ụfọdụ ka e ji ọlaọcha kpụọ. Ndị ọzọ dịkwa e ji osisi ma ọ bụ aja kpụọ. Efere ndị ahụ dị oke ọnụ ahịa bụ nke e ji enye ndị ọbịa nri. Ma ndị ahụ dị ọnụ ala, bụ ndị e ji esi ihe, ma ọ bụ ndị e ji ekpofu unyi.
21
Ọ bụrụ na onye ọ bụla edozie onwe ya ọcha hapụ ime mmehie, ọ ga-adị ka efere ndị e ji ọlaedo kpụọ, nke a na-enye nsọpụrụ nꞌụlọ ahụ. Ọ ga-abụkwa onye e doro iche, onye Kraịst doziri iji rụọ ọrụ ọma nile.
22
Gbanarị ihe ọ bụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorọbịa naenwe nꞌime gị. Kama nọọ nso ihe ọ bụla ga-eme gị ịchọ ime ezi ihe. Bụrụ onye nwere okwukwe na ịhụnanya na onye mmekọrịta nke ya ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya na ndị nwere obi ọcha na-atọ ụtọ.
23
Wezuga onwe gị nꞌịrụ ụka nzuzu nile, nꞌihi na ị maara na ha na-eweta ise okwu na ịlụ ọgụ.
24
O kwesịkwaghị ka ụmụ Chineke bụrụ ndị na-ese okwu ma ọ bụ ndị na-alụ ọgụ. Kama ha ga-abụ ndị dị nwayọọ na ndị ji ntachi obi na-ezi ndị jehiere ụzọ ihe.
25
Jiri obi dị nwayọọ mgbe ị na-ezi ndị naadịghị agbaso ụzọ eziokwu ahụ ihe. Nꞌihi na ọ bụrụ na i jiri obi dị nwayọọ na nsọpụrụ gwa ha okwu, ha nwere ike site nꞌinyeaka Chineke chegharịa, site nꞌihe na-abụghị eziokwu kwere nꞌihe bụ eziokwu.
26
Mgbe ahụ, site nꞌinyeaka gị, ha ga-aghọta eziokwu ahụ, wezuga onwe ha site nꞌọnya nke ekwensu gbaara ha, nke ọ chọrọ isite na ya jide ha, ime ka ha na-eme uche ya. Ha ga-ebido ime ihe Chineke naachọ.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4