bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Colossians 1
Colossians 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 2 →
1
Ọ bụ Pọl, onye e mere onyeozi site nꞌọchịchọ Kraịst Jisọs, na ọchịchọ Chineke, ya na nwanna anyị Timoti,
2
na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị akwụkwọ a. Ndị ahụ bụ ụmụnna anyị nꞌime Kraịst site nꞌokwukwe ha. Ka Chineke Nna anyị nye unu amara ya na udo ya.
3
Mgbe ọ bụla anyị na-ekpere unu ekpere, anyị na-ekele Chineke onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele.
4
Nꞌihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nꞌime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị Chineke nꞌanya.
5
Mgbe eziokwu ahu bụ ozi ọma rutere unu, unu nụrụ banyere olileanya dịrị ndị nabatara ya. Nꞌihi ya okwukwe unu na ịhụnaya unu na-ele anya ya, bụ ihe e chebere nke ọma nꞌihi unu nꞌeluigwe.
6
Ozi ọma ahụ e kwusaara unu bụkwa otu ozi ọma ahụ a na-agbasa nꞌụwa nile, nke na-eweta mgbanwe na ndụ ndị nụrụ ya, dị ka o si wetara unu mgbanwe mgbe unu nụrụ ya, ghọtakwa ụdị obi ebere Chineke nwere nꞌebe ndị mmehie nọ.
7
Ọ bụ Epafras onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, onye anyị hụkwara nꞌanya, wetaara unu ozi ọma a. Epafras bụ odibo Kraịst, onye nọ ugbu a na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ unu.
8
Ọ bụ ya gwara anyị ihe banyere ịhụnanya Mmụọ Nsọ nyere unu.
9
Nꞌihi nke a site nꞌụbọchị anyị nụrụ ihe banyere unu, anyị esepụghị aka ikpere unu ekpere. Anyị na-ekpe ekpere na-arịọ Chineke ka o nyere unu aka ịghọta ihe ọ chọrọ ka unu mee. Anyị na-arịọkwa ya ka o nye unu amamihe nke ga-enyere unu aka ịmata ihe nke mmụọ.
10
Ka unu si otu a bie ndụ dị ka Onyenwe anyi chọrọ. Ka unu bụrụkwa ndị na-eme ihe ọma mgbe nile, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, na ndị na-eto eto nꞌihe banyere ịma Chineke mgbe nile.
11
Anyị na-arịọkwa Chineke ka ọ gbaa unu ume, ka o mejụpụta unu nꞌike ya dị ebube ka unu nwee ike ịga nꞌihu nꞌọrụ unu nꞌọnọdụ ọ bụla, bụrụkwa ndị jupụtara nꞌọṅụ nke Onyenwe anyị na-enye,
12
na ndị na-ekele Nna anyị ekele mgbe nile, nꞌihi na o mere ka anyị bụrụ ndị kwesịrị iketa oke nꞌihe nile ahụ o mere ka ọ bụrụ nke ndị ahụ bi nꞌalaeze nke ìhè.
13
Nꞌihi na ọ bụ ya sitere nꞌike nke ọchịchịrị, bụ alaeze ekwensu, gbapụta anyị, ma kpọbata anyị nꞌime alaeze Ọkpara ya ọ hụrụ nꞌanya.
14
Onye e sitere nꞌaka ya mee ka anyị nwere onwe anyị; onye gbaghakwaara anyị mmehie anyị nile.
15
Kraịst bụ nnọọ oyiyi Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya. Ọ nọ na-adị ndụ tupuu Chineke ekee ihe ọ bụla e kere eke.
16
Nꞌezie, ọ bụ site nꞌaka Kraịst ka e ji kee ihe nile dị nꞌụwa na nke dị nꞌeluigwe, ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya. Ike nile dị iche iche, ma ike nile nke mmụọ dị iche iche, ya na ndị isi ha nile, na alaeze ha, ma ndị na-achị achị nꞌetiti ha, ma ndị na-atụ ihe ga-eme eme. Kraịst kere ihe nile. O kere ha iji ha ịrụ ọrụ dị ka o si dị ya mma, na isite na ha wetara onwe ya otuto.
17
Kraịst nọ anọ tupuu e kee ihe nile, ọ bụkwa ike aka ya ka o ji ejikọta ihe nile, mee ka ha dịrị ebe ha dị.
18
Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị, nzukọ Kraịst ahụ o bidoro. O sitere nꞌọnwụ bilie bụrụ onyeisi mbụ nꞌetiti ndị nile ga-esi nꞌọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nꞌime ihe nile.
19
Nꞌihi na ọ bụ mkpebi Chineke nꞌonwe ya, na ọdịdị ya bụ Chineke ga-apụta ìhè nꞌime Ọkpara ya.
20
Ọ bụ site nꞌihe Ọkpara ya mere ka Chineke ji kpebie ka ụwa nile bịaghachikwute ya. Nꞌihi na site nꞌọnwụ nke Kraịst nwụrụ nꞌelu obe, na ọbara ọ wụsịrị, e meela ka udo dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ nile. Ihe nile dị nꞌụwa na nꞌeluigwe nwekwara ike ịbịakwute Chineke ugbu a.
21
Nke a metụtakwara unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-anọghị Chineke nso na mbụ. Mgbe ahụ unu bụ ndị iro ya, ndị mmehie ha na echiche ọjọọ ha, na omume ọjọọ ha, mere ka Chineke dị anya nꞌebe unu nọ. Ma ugbu a, ọ kpọbatala unu dị ka ndị enyi ya.
22
Chineke mere nke a site nꞌọnwụ nke Ọkpara ya nwụrụ nꞌelu obe, nke mere ka unu bụrụ ndị enyi ya, ndị a kpọbatara nꞌihu ya, ndị guzokwa nꞌihu ya dị ka ndị dị nsọ na ndị dị ọcha, ndị na-enweghị ntụpọ ọ bụla.
23
Ihe ọzọ Chineke chọrọ nꞌaka unu bụ ka unu nọgide bụrụ ndị guzosiri ike nꞌihe unu kwenyere, na ndị guzosiri ike nꞌime Onyenwe anyị, ndị ozi ọma ahụ doro anya nke ọma. Ozi ọma ahụ nke kwuru na Jisọs nwụrụ nꞌihi unu. Hụnụ na unu esiteghị nꞌozi ọma a wezuga onwe unu, ma ọ bụ kwụsị ịtụkwasị ya obi ịzọpụta unu. Nke a bụ ozi ọma ahụ e wetaaara unu nke a na-ezisakwa nꞌụwa nile. Mụ onwe m bụ Pọl, jikwa ọṅụ na-agwa ya ndị ọzọ.
24
Nꞌezie, ana m aṅụrị ọṅụ nꞌihi na m na-ata ahụhụ ndị a, ana m emejupụta ihe fọdụrụ nꞌahụhụ ahụ Kraịst tara nꞌihi anụ ahụ ya bụ chọọchị.
25
Chineke emeela ka m bụrụ odibo chọọchị ya. O nyere m ọrụ a m na-arụ nꞌihi ọdịmma unu.
26
Nzube dị omimi ahụ o zonarịrị mmadụ nile nꞌoge gara aga, nke o mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị ya hụrụ ya nꞌanya nꞌoge a.
27
Ọ bụkwa ọchịchọ Chineke ime ka ndị mba ọzọ mata ịba ụba na ịdị ebube nke nzube ya dị omimi. Ihe omimi ahụ bụkwa nke a, na obibi nke Kraịst bi nꞌime unu, bụ nanị olileanya unu nwere iketa oke nꞌebube Chineke.
28
Ọ bụ ya mere ebe ọ bụla anyị gara, anyị na-ekwusa ihe banyere Kraịst, na-ezikwa ihe nile anyị maara banyere ya. Nꞌihi na anyị chọrọ ịkpọbata onye ọ bụla nꞌihu Chineke dị ka ndị zuru oke, nꞌihi ihe Kraịst meere ha nꞌotu nꞌotu.
29
Nke a bụ ọrụ m na-arụ. Ana m arụkwa ya nꞌihi ike dị ukwuu nke na-arụkwa ọrụ nꞌime m.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4