bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Colossians 2
Colossians 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 3 →
1
Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu ga-ghọta otu m si gbasie mgba ike nꞌekpere m nꞌihi unu, na nꞌihi ndị nọ nꞌobodo Laodisia, na ndị nile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu.
2
Ihe m na-arịọ Chineke nꞌihi unu bụ ka ọ gbaa unu ume, jikọtaa unu nꞌotu nꞌime ịhụnanya, ka unu nwee ike ịmaju Kraịst nke ọma, na ịghọtazi ya. Nꞌihi na nzube omimi nke Chineke ahụ bụ Kraịst nꞌonwe ya.
3
Onye matara Kraịst nke ọma enweela amamihe nile, na ihe ọmụma nile, nꞌihi na Kraịst dị ka ụlọ akụ, ọ bụkwa nꞌime ya ka ihe zoro ezo nile nke amamihe na ihe ọmụma dị.
4
Ana m agwa unu ihe ndị a nꞌihi na ma eleghị anya ụfọdụ mmadụ ga-abịa iji okwu dị ụtọ duhie unu.
5
Nꞌihi na ọ bụ ezie na anọghị m unu nso, ma anọ m nꞌetiti unu nꞌime mmụọ oge nile. Ọ na-atọ m ụtọ nke ukwuu na unu guzosiri ike nꞌokwukwe unu nꞌime Kraịst.
6
Ya mere, dị ka unu si nabata Kraịst Jisọs kwere na ya ịzọpụta unu, sikwanụ otu a tụkwasị ya obi inyere unu aka na nsogbu unu nke ụbọchị nile. Na-ebinụ ndụ unu nꞌime ya.
7
Bụrụnụ ndị mgbọrọgwụ ha mibanyere nꞌime ya, ka unu si otu a na-enweta ike unu, na nri unu nꞌime ya. Gbalịanụ ito eto, bụrụnụ ndị dị ike na ndị maara okwu ya. Ka ndụ unu jupụta nꞌọṅụ na ekele nꞌihi ihe nile o meere unu.
8
Ekwelanụ ka onye ọ bụla jiri okwu amamihe nke ụwa mebie ọṅụ unu, na okwukwe unu, okwu amamihe ahụ nke ọsịsa ya nile dabeere nꞌechiche na ntụpụta mmadụ, kama ịdabere nꞌihe Kraịst kwuru.
9
Nꞌihi na nꞌime Kraịst ka e nwere ụdị izu oke Chineke nke pụrụ ịpụta ìhè nꞌahụ mmadụ.
10
Ya mere, unu nwere ihe nile nꞌime Kraịst. Ọ bụ ya na-achị ihe nile, onye ike ya karịrị ike nile na ọchịchị nile.
11
Mgbe unu bịakwutere Kraịst o mere ka unu nwere onwe unu site nꞌike ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ jupụtara na mmehie. O meghị ka unu nwere onwe unu site nꞌibi unu ugwu nke elu ahụ, kama o mere ya site nꞌobibi ugwu nke ime mmụọ, ime mkpụrụ obi unu baptizim.
12
Nꞌihi na mgbe e mere unu baptizim, o gosiri na unu na ya nwụkọrọ, na e likọtakwara unu na ya. Mgbe ahụ kwa ka unu sooro Kraịst si nꞌọnwụ bilie banye na ndụ ọhụrụ, nꞌihi na unu kweere nꞌokwu Chineke dị ukwuu ahụ, onye mere ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie.
13
Mgbe ahụ, unu bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ unu nꞌihi mmehie, mgbe ahụ kwa, unu bụ ndị mba ọzọ, ndị na-enweghị iwu na-achị ndụ ha, ma Chineke mere ka unu soro Kraịst keta ndụ ọhụrụ, nꞌihi na ọ gbaghaara unu mmehie unu nile.
14
O hichapụrụ ụgwọ mmehie nile unu ji, ụgwọ iwu ahụ nile unu na-edebeghị. O weere mmehie ndị a nile laa ha nꞌiyi, site nꞌịkpọgide ya nꞌelu obe Kraịst.
15
Nꞌelu obe ahụ, Chineke napụrụ ekwensu ike o ji ebo unu ebubo mmehie. O mekwara ka mmeri Kraịst meriri ekwensu nꞌelu obe ahụ e si wezuga mmehie unu, pụta ìhè nye mmadụ nile.
16
Nꞌihi ya, unu ekwela ka onye ọ bụla gụọra unu iwu banyere ihe ọ bụla unu na-eri, ma ọ bụ ihe unu na-aṅụ, ma ọ bụ ihe banyere ido ụbọchị nsọ, ma ọ bụ ime mmemme ọnwa ọhụrụ ma ọ bụ mmemme ụbọchị izuike.
17
Nꞌihi na emeghị ka ihe ndị a bụrụ ihe ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Uru ha bara gwụsịrị mgbe Kraịst bịara. Nꞌihi na ha bụ onyinyo na-egosi ihe ga-abịa abịa, bụ Kraịst nꞌonwe ya.
18
Ekwela ka onye ọ bụla gụọ gị dị ka onye furu efu nꞌihi na i kweghị iso ya fee ndị mmụọ ozi, dị ka ha si kwuo. Ha pụrụ ikwu na ha hụrụ ọhụ, gwa unu na unu kwesịrị ịhụ ụdị ihe ha hụrụ. Ndị dị otu a na-afụli onwe ha elu nꞌefu, nꞌihi ụdị echiche mmadụ a ha na-eche.
19
Ma e jikọtaghị ha na Kraịst, onye bụ isi ebe e jikọtara anyị nile bụ anụ ahụ ya. Nꞌihi na ọ bụ akwara dị ya nꞌahụ jikọtara anyị nile nꞌotu. Ito eto anyị bụkwa nanị mgbe anyị si na ya na-eriju afọ, na-anatakwa ike na ume.
20
Ebe ọ bụ na unu sooro Kraịst nwụọ mgbe ọ nwụrụ, ọ bụrụkwa na unu enwerela onwe unu site nꞌiso ụzọ ntụpụta nke ụwa, dị ka ịrụ ezi ọrụ na idebe iwu dị iche iche, gịnị mekwaranụ unu ji na-eso ha ugbu a na-ekwe ka e jiri iwu ha na-atụrụ unu ihe unu ga-eme, na ihe unu na-ekwesịghị ime, dị ka, “Erila nke a,” “Edetụla nke a ire,” “Ebitụla nke a aka?”
22
Ọ bụ mmadụ tụpụtara iwu ndị a nile, ma e mere nri ka ọ bụrụ ihe a ga-eri eri, nke e kwesịrị iji mee ihe.
23
Ọ bụ ezie na iwu ndị a na-adị ka ihe dị mma, nꞌihi na onye na-edebe ha kwesịrị itunyezi uche ya idebe ha, bụrụkwa ihe na-ewetara mmadụ obi umeala na ihe na-enye ahụ anyị ahụhụ, ma o nweghị uru ha bara nꞌihe gbasara inwe mmeri nꞌebe echiche ọjọọ na ọchịchọ ọjọọ mmadụ dị. Ihe iwu a na-eme bụ nanị ime ka mmadụ na-afụli onwe ya elu.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4