bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Colossians 4
Colossians 4
Igbo 1988
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
1
Unu ndị nwe odibo, werenụ ezi obi na obi dị umeala na-emeso odibo unu mmeso. Chetakwanụ na ọ dị onye ka unu ukwu, Onyenwe unu, nke bi nꞌeluigwe, onye nọkwa na-ele unu anya.
2
Na-anọgidenụ nꞌekpere. Nọọkwanụ na nche mgbe unu na-ekpe ekpere, ma na-ekelekwanụ Chineke ekele.
3
Na-echetakwanụ anyị nꞌekpere, ka Chineke meghere anyị ụzọ ikwusa ozi ọma, nke bụ ikwusa ihe omimi Kraịst. Ọ bụkwa nꞌihi ikwusa ozi ọma a ka m ji nọrọ nꞌụlọ mkpọrọ taa.
4
Na-ekperenụ m ekpere ka m nwee ike ịkọwa ozi ọma a nꞌụzọ ọ ga-esi kwe mmadụ nile ịghọta ya.
5
Kpacharanụ anya otu unu si akpasị ndị na-ekweghị ekwe agwa. Ohere ọ bụla unu nwere jirinụ ya mee ka ndị ọzọ nụrụ ozi ọma a.
6
Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke na-atọ ụtọ na ntị. Mụtakwanụ otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.
7
Tikikọs, ezi nwanna anyị, onye kwesịkwara ntụkwasị obi nꞌọrụ Onyenwe anyị, onye anyị na ya na-ejekọ ozi nꞌọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu akụkọ nile banyere m.
8
Ana m ezitere unu ya ka ọ gbaa unu ume, site nꞌịkọrọ unu otu anyị si agbalị.
9
Ezi nwanna anyị nwoke bụ Onisimọs, onye kwesịrị ntụkwasị obi, onye bụkwa otu nꞌime unu, so ya na-abịa. Ha ga-agwa unu ihe nile na-eme nꞌebe a.
10
Aristakọs, onye mụ na ya nọ nꞌụlọ mkpọrọ, na-ekele unu. Mak nwanne Banabas na-ekelekwa unu. Dị ka m kwuru na mbụ, jirinụ obi unu nile nabata Mak mgbe ọ bịarutere nꞌebe unu nọ.
11
Jisọs, onye aha ya ọzọ bụ Jọstus na-ekelekwa unu. Mmadụ atọ ndị a bụ nanị ndị Juu mụ ha na-arụkọ ọrụ alaeze Chineke nꞌebe a. Ha na-eme nnọọ nke ọma, na-enye m obi ụtọ.
12
Epafras, odibo Kraịst Jisọs na onye bụkwa otu onye nꞌime ọgbakọ unu na-ekele unu. Oge nile ka ọ na-ekpe ekpere nꞌihi unu, na-arịọ ka unu guzosie ike nꞌokwukwe dị ka ndị tozuru oke, ndị maara ihe ha na-eme, ndị weere onwe ha nyefee nꞌaka ọchịchọ Chineke.
13
Ana m agba akaebe na ọ na-adọgbu onwe ya nꞌọrụ ikpe ekpere nꞌihi unu na nꞌihi ndị Laodisia na ndị Hierapolis.
14
Luuku onye dibia ukwu anyị na Dimas na-ekele unu.
15
Keleerenụ m ụmụnna anyị ndị bi na Laodisia na nwanna anyị nwoke Nimfas na chọọchị na-ezukọ nꞌụlọ ya.
16
Mgbe unu gụchara akwụkwọ a, hụnụ na a gụkwara ya na nzukọ Kraịst dị na Laodisia. Gụọkwanụ nꞌotu mgbe ahụ akwụkwọ nke m deere ndị Laodisia.
17
Gwanụ Akipos ka ọ kpachapụ anya rụchaa ọrụ Chineke nyere ya ịrụ.
18
Ka m jiri aka m dee ekele nke m: mụ onwe m Pọl na-ekele unu. Unu echefula na m nọ nꞌagbụ nꞌụlọ mkpọrọ. Ka amara Chineke dịnyere unu.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
All chapters:
1
2
3
4