bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Esther 4
Esther 4
Igbo 2006
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 5 →
1
Ma Mọdekai mara ihe nile emere, Mọdekai we dọwa uwe-ya nile, yikwasi ákwà-nkpe, kpokwasi ntu n'aru-ya, pua je n'etiti obodo, tie oké nkpu di ilu:
2
o we bia rue n'iru ọnu-uzọ-ama eze: n'ihi na ọ dighi onye gābà n'ọnu-uzọ-ama eze n'uwe nke ákwà-nkpe.
3
Ọzọ, n'ala nile ọ bula anāchi achi, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, oké iru-újú ndi-Ju, na obubu-ọnu, na ikwa-ákwá, na iti-aka-n'obi; atusa-kwa-ra ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ọtutu madu.
4
Umu-ab͕ọghọ Esta na ndi-onozi-ya we bia gosi ya; o we nēb͕u nwunye eze ahu nb͕u n'obi nke-uku; o we zìe uwe iyikwasi Mọdekai, na iwezuga ákwà-nkpe-ya n'aru-ya: ma ọ naraghi ha.
5
Esta we kpọ Hatak, bú otù onye nime ndi-onozi eze, onye eze mere ka o guzo n'iru ya, o we nye ya iwu ijekuru Mọdekai, imara ihe nka bu, na ihe kpatara nka.
6
Hatak we pukuru Mọdekai rue amá obodo ahu, nke di n'iru ọnu-uzọ-ama eze.
7
Mọdekai we gosi ya ihe nile mere ya, kọ-kwa-ra ya isi ego ahu nke Heman siri na ọ gātù nye n'ulo-àkù eze n'ihi ndi-Ju, ime ka ha la n'iyì.
8
Ọzọ, ndeputa odide-akwukwọ iwu ahu nke enyere nime Shushan ikpochapu ha, o nyere ya ya, ime ka Esta hu ya, na igosi ya; na inye ya iwu ibakuru eze, iriọ ya aririọ-amara, na ichọrọ ndi-ya ihe n'iru ya.
9
Hatak we bia gosi Esta okwu Mọdekai nile.
10
Esta we gwa Hatak okwu, nye ya iwu inye Mọdekai, si:
11
Ndi-orù nile nke eze, na ndi ala anāchi achi nke eze, mara, na nwoke ọ bula, ma-ọbu nwayi ọ bula, nke gābakuru eze, rue ogige di ime-ime, bú onye anākpọghi, otù iwu-ya bu ka eme ka ha nwua, nāgughi onye eze nēsetiri nkpa-n'aka ọla-edo, ka ọ di ndu: ma akpọghi mu onwem ibakuru eze orú ubọchi na iri ndia.
12
Ha we gosi Mọdekai okwu Esta nile.
13
Mọdekai we si ha zaghachi Esta, si, Ekwula na nkpuru-obi-gi na i gēwepuga onwe-gi n'ulo eze, kari ndi-Ju nile.
14
N'ihi na ọ buru na i b͕a nkiti ghara ikwu okwu ọ bula na mb͕e a, oghere na nnaputa gēguzoro ndi-Ju site n'ebe ọzọ, ma agēme ka gi onwe-gi na ulo nna-gi la n'iyì: ma ònye mara ma ọ bu n'ihi mb͕e di otú a ka i biaruru ala-eze?
15
Esta we si ha zaghachi Mọdekai okwu, si,
16
Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n'uzọ di otú a ka m'gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n'iyì, alawom n'iyì.
17
Mọdekai we gabiga, me dika ihe nile si di nke Esta nyere ya n'iwu.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10