bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Esther 7
Esther 7
Igbo 2006
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 8 →
1
Eze na Heman we bata iso Esta, bú nwunye eze, ṅu manya-vine.
2
Eze we si kwa Esta n'ubọchi nke-abua, n'ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi, Esta, nwunye eze? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme kwa ya.
3
Esta, bú nwunye eze we za, si, Ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma, ka enyem ndum n'aririọm, na ndim n'ọchichọm:
4
n'ihi na erewo ayi, bú mu onwem na ndim, ikpochapu ayi, na ib͕u ayi, na ime ka ayi la n'iyì. Ma asi na erewo ayi ibu ndi-orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, m'gāb͕a nkiti, ọ bu ezie na onye-nkpab͕u agaghi-emezu n'ihe gēfunari eze.
5
Eze, bú Ahasuerọs, we za, si Esta, bú nwunye eze, Ònye ka ọ bu, bú onye a? òle ebe onye a nọ kwa, bú onye ahu nke obi-ya mere ka o zue ime otú a?
6
Esta we si, Otù onye-nkpab͕u na onye-iro, bú Heman ọjọ a. Heman we tua egwu nke-uku n'iru eze na nwunye eze.
7
Eze we si n'ọṅuṅu manya-vine bilie n'ọnuma-ya je n'ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya: ma Heman guzoro ichọ ndu-ya n'aka Esta, bú nwunye eze; n'ihi na ọ huru na eze zubesiri ihe ọjọ ike megide ya.
8
Eze we si n'ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya biaghachi n'ulo ọṅuṅu manya-vine ahu; ma Heman adawo n'elu ihe-ndina nke Esta nọ n'elu ya. Eze we si, Ọ̀ gēweda kwa nwunye eze n'ala n'irum n'ulom? Mb͕e okwu ahu putara n'ọnu eze, ha kpuchiri iru Heman.
9
Habona, bú otù onye nime ndi-onozi ndi nọ n'iru eze, we si, Le kwa, osisi ahu nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, nke Heman mere nye Mọdekai, bú onye kwuru ezi ihe bayere eze, o nēguzo n'ulo Heman. Eze we si, Kwubanu ya n'elu ya.
10
Ha we kwuba Heman n'elu osisi nke o doziri nye Mọdekai. Ewe me ka ọnuma eze bìe.
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10