bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Esther 6
Esther 6
Igbo 2006
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 7 →
1
N'abali ahu urá eze fepuru n'anya-ya; o we si ka ewebata akwukwọ ihe-ncheta nke ihe emere n'ubọchi ahu, ewe nāgu ha n'iru eze.
2
Ewe hu ihe a nke edere n'akwukwọ, bú na Mọdekai gosiri ihe bayere Bignata na Teresh, bú ndi-onozi abua nke eze, nime ndi nēche ngata-uzọ, ndi chọrọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs.
3
Eze we si, Nsọpuru na idi-uku gini ka emere Mọdekai n'ihi ihe a? Ndi-ozi eze, bú ndi nējere ya ozi, we si, Ọ dighi ihe emere ya.
4
Eze we si, Ònye nọ n'ogige? Ma Heman abatawo n'ogige ulo eze nke di n'èzí, isi eze ka ọ kwuba Mọdekai n'osisi nke o doziri nye ya.
5
Ndi nējere eze ozi we si ya, Le, Heman nēguzo n'ogige. Eze we si, Ya bata.
6
Heman we bata. Eze we si ya, Gini ka agēme nwoke ahu, bú onye nsọpuru-ya tọworo eze utọ? Heman we si n'obi-ya, Ònye ka ọ nātọ eze utọ inye nsọpuru karim?
7
Heman we si eze, Nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ,
8
ka achita uwe ala-eze nke eze yiriworo, na inyinya nke eze nọkwasiworo, na okpu-eze nke ala-eze nke ekpukwasiworo ya n'isi:
9
ka enye kwa uwe ahu na inyinya ahu n'aka otù nwoke nime ndi-isi eze, ndi bu eze, ka ha yikwasi kwa nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ, ka ha me kwa ka inyinya būru ya ga n'amá obodo, ka ha kpọ kwa n'iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.
10
Eze we si Heman, Me ngwa, chiri uwe ahu na inyinya ahu, dika i si kwu, me-kwa-ra Mọdekai otú a, bú onye-Ju, nke nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze: ka okwu ọ bula ghara idapu n'ihe nile nke i kwuworo.
11
Heman we chiri uwe ahu na inyinya ahu, yikwasi Mọdekai, me ka inyinya būru ya ga n'amá obodo, ọ kpọ-kwa-ra n'iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.
12
Mọdekai we laghachi n'ọnu-uzọ-ama eze. Ma Heman were ngwa la n'ulo-ya, nēru újú, ekpuchi-kwa-ra isi-ya.
13
Heman we kọrọ Zeresh, bú nwunye-ya, kọ-kwa-ra ndi nile nāhu ya n'anya, ihe nile nke mere ya. Ndi-ya mara ihe na Zeresh, bú nwunye-ya, we si ya, Ọ buru na Mọdekai sitere na nkpuru ndi-Ju, bú onye i maliteworo ida n'iru ya, i gaghi-enwe ike imegide ya, kama i ghaghi ida n'iru ya.
14
Mb͕e ha na ya nọ nēkwurita okwu, ndi-onozí eze biaruru nso, we me ngwa ime ka Heman bata n'ọṅuṅu-manya-vine nke Esta mere.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10