bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
John 16
John 16
Igbo 2006
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 17 →
1
Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka ewe ghara ime ka unu ma n'ọnyà.
2
Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.
3
Ihe ndia ka ha gēme kwa, n'ihi na ha amaghi Nnam, ha amaghi kwa Mu.
4
Ma okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka, mb͕e ọ bula oge hour ha gābia, ka unu we cheta ha, na Mu onwem gwara unu. Ma agwaghm unu okwu ndia site na mbu, n'ihi na Mu na unu nọri.
5
Ma ub͕u a anamalakuru Onye ziterem; ọ dighi kwa onye ọ bula nime unu nājum, Òle ebe I nāla?
6
Kama n'ihi na M'gwawo unu okwu ndia, ihe-nwuta ejuputawo obi-unu.
7
Otú ọ di, Mu onwem nāgwa unu ezi-okwu; Ọ bu ihe bara unu urù ka Mu onwem la: n'ihi na asi na alaghm, Onye-nkasi-obi ahu agaghi-abiakute unu; ma ọ buru na alam, M'gēzite Ya nye unu.
8
Onye ahu, mgbe Ọ gābia, Ọ gātu kwa uwa nmehie, na ezi omume, na ikpé, n'anya:
9
nmehie, n'ihi na ha ekweghi na Mu;
10
ezi omume, n'ihi na anamalakuru Nnam, unu adighi-ahu-kwam ọzọ site n'ub͕u a;
11
ikpé, n'ihi na ekpewo onye-isi uwa nka ikpé.
12
Enwerem ọtutu ihe ọzọ igwa unu, ma unu apughi ibūru ha ub͕u a.
13
Ma mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēdubà unu n'ezi-okwu nile: n'ihi na Ọ gaghi-ekwu n'Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia.
14
Onye ahu gēto Mu onwem: n'ihi na Ọ gēwere n'ihe nkem, kọ-kwa-ra unu ya.
15
Ka ha ra, bú ihe nile Nnam nēnwe, bu nkem: n'ihi nka ka M'siri, na Ọ nēwere n'ihe nkem, gākọ-kwa-ra unu ya.
16
Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam, ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam.
17
Ya mere ufọdu nime ndi nēso uzọ-Ya siritara ibe-ha, Gini bu okwu a nke Ọ nāgwa ayi, si, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam, ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam: na, N'ihi na anamalakuru Nnam?
18
Ya mere ha nāsi, Gini bu okwu a nke Ọ nēkwu, Ọ fọduru nwa oge? Ayi amataghi ihe Ọ nēkwu.
19
Jisus mara na ha nāchọ iju Ya, O we si ha, Ùnu nājurita onwe-unu ihe bayere nka, na M'siri, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam ọzọ; ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam?
20
N'ezie, n'ezie, asim unu, na unu onwe-unu gēti nkpu ákwá, kwa kwa ákwá, ma uwa gāṅuri ọṅu: ọ gēwuta unu onwe-unu, ma nwuta-unu gāghọ ọṅù.
21
Nwanyi, mb͕e ọ bula ime nēme ya, o nwere ihe-nwuta, n'ihi na oge hour ya abiawo: ma mb͕e ọ bula ọ muputara nwa, o chetaghi ahuhu-ya ọzọ, n'ihi ọṅù-ya na amuputara madu n'uwa.
22
Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M'gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu.
23
N'ubọchi ahu ọ dighi ihe ọ bula unu gājum. N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu gāriọ Nnam ihe ọ bula, Ọ gēnye unu ya n'aham.
24
Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n'aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke.
25
Agwawom unu ihe ndia n'ilu: oge hour nābia, mb͕e M'nāgaghi-agwa unu okwu n'ilu ọzọ, kama M'gāgwawa unu okwu bayere Nnam.
26
N'ubọchi ahu unu gāriọ n'aham: ma asighm unu, na Mu onwem gēkpere Nnam n'ihi unu;
27
n'ihi na Nnam onwe-ya nāhu unu n'anya, n'ihi na unu onwe-unu huworom n'anya, kwere kwa na Mu onwem siri n'ebe Nnam nọ puta.
28
Esirim na Nnam puta, abiawokwam n'uwa: ọzọ, anamarapu uwa, nāgakuru kwa Nnam.
29
Ndi nēso uzọ-Ya si, Le, ub͕u a I nēkwuwa okwu, I dighi-atu kwa ilu.
30
Ub͕u a ayi nāmata na I matara ihe nile, na ọ dighi kwa Gi nkpà ka onye ọ bula jua Gi: nka ka ayi ji kwere na I siri n'ebe Chineke nọ puta.
31
Jisus zara ha, si, Ọ̀ bu ub͕u a ka unu kwere?
32
Le, oge hour nābia, ọ biawo kwa, ka unu gāb͕asa, onye ọ bula ọ la na nke ya, unu gārapu kwa nání Mu: otú ọ di, nání Mu anọghi, n'ihi na Mu na Nnam nọ.
33
Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka unu we nwe udo nimem. N'uwa unu nēnwe nkpab͕u: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21