bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
John 17
John 17
Igbo 2006
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 18 →
1
Okwu ndia ka Jisus kwuru: O we welie anya-Ya le elu-igwe, si, Nnam oge hour abiawo; nye Ọkpara-Gi otuto, ka Ọkpara-Gi we nye Gi Otuto:
2
dika I nyere Ya ike n'ebe madu nile nọ, ka ihe ọ bula I nyeworo Ya, ka O we nye ha ndu ebighi-ebi.
3
Ma nka bu ndu ebighi-ebi ahu, ka ha mara Gi, Nke nání Gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere, bú Jisus Kraist.
4
Mu onwem nyere Gi otuto n'elu uwa, ebe M'luzuru ọlu I nyeworom ka M'lua.
5
Nna, Gi onwe-gi were kwa otuto nke M'nwere n'ebe I nọ mb͕e uwa akādighi nyem otuto ub͕u a nebe Gi onwe-Gi nọ.
6
Emerem ka aha-Gi puta ìhè nye ndi I nyerem site 'uwa: Gi onwe-gi nwere ha, I were kwa ha nyem; ha edebewo kwa okwu-Gi.
7
Ha mara ub͕u a na ihe nile, ka ha ra, bú nke I nyeworom, si n'ebe I nọ puta:
8
n'ihi na okwu I nyerem ka M'nyeworo ha; ha onwe-ha we nara ha, mara kwa n'ezie na esim n'ebe I nọ puta, ha kwere kwa na Gi onwe-gi ziterem.
9
Mu onwem nēkpe ekpere bayere ha: ọ bughi uwa ka M'nēkpe ekpere bayere ya, kama anamekpe ekpere bayere ndi I nyeworom; n'ihi na ha bu nke Gi:
10
ihe nile nke bu nkem bu kwa nke Gi, nke Gi bu kwa nkem: enyewokwam otuto nime ha.
11
Anọkwaghm n'uwa ọzọ, ma ndia nọ n'uwa, Mu onwem nābiakute kwa Gi. Nna di nsọ, nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom, ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu.
12
Mb͕e Mu na ha nọri, Mu onwem nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom: eche-kwa-ram ha, ọ dighi kwa onye ọ bula nime ha lara n'iyì, ma-ọbughi nwa nke ila-n'iyì ahu; ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu.
13
Ma anamabiakute Gi ub͕u a; okwu ndia ka M'nēkwu kwa nuwa, ka ha we nwe ọṅùm ka o zuworo nime onwe-ha.
14
Mu onwem enyewo ha okwu-Gi; uwa kpọ-kwa-ra ha asì, n'ihi na ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa.
15
Ekpeghm ekpere ka I wepu ha n'uwa, kama ka I debe ha ka ha pua n'aka ajọ onye ahu.
16
Ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa.
17
Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu.
18
Dika I zigaram nime uwa, Mu onwem ziga-kwa-ra ha nime uwa.
19
N'ihi ha ka Mu onwem nēdo kwa Onwem nsọ, ka ewe do kwa ha onwe-ha nsọ n'ezi-okwu.
20
Ọ bughi kwa nání ndia ka M'nēkpe ekpere bayere ha, kama anamekpe kwa ekpere bayere ndi kwere na Mu site n'okwu-ha;
21
ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem.
22
Otuto nke I nyeworom ka Mu onwem nyewo-kwa-ra ha; ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu otù;
23
Mu onwem nime ha, Gi onwe-gi kwa nimem, ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù; ka uwa we mara na Gi onwe-gi ziterem, na I hu-kwa-ra ha n'anya, dika I hurum n'anya.
24
Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n'ihi na I hurum n'anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa.
25
Nna Nke bu Onye ezi omume, uwa amaghi Gi, ma Mu onwem mara Gi; ndia ndia ma-kwara na Gi onwe-gi ziterem;
26
eme-kwa-ram ka ha mara aha-Gi, M'gēme kwa ka ha mara ya; ka ihu-n'anya I ji hum we di nime ha, Mu onwem kwa nime ha.
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 18 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21